Binta Sukai

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ


Binta Sukai
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereBinta Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye asọmpi ịma mma Dezie
mmeriNwaanyị Naịjirịa Dezie

Binta Sukai bụ onye n'enye ndumodu gbasara ejiji si Naijiria.

Ndị mụrụ Sukai gbara alụkwaghịm mgbe ọ ka bụ nwata. Ọ bụ nne na nna ya ochie si Scotland zụlitere ya na United Kingdom ebe ọ gụrụ akwụkwọ, mana mgbe ụfọdụ ya na nne ya bi na Nigeria. Ọ bịara bụrụ onye a ma ama mgbe e nyere ya okpu ọchịchị nke Miss Nigeria na 1990[1], mana a tụlere esemokwu na ọ bụghị onye Naịjirịa, ruo mgbe e gosipụtara na soso obere obara ndị Scotland di ya na-arụ. Agbanyehi na akpọrọ ya onye ugwu hausa mbụ meriri Miss Nigeria (nna ya so na ndị Ham, ebo nke dị na ndịda Kaduna), mana otu onye ọzọ eruolarị mgbe enyere Grace Oyelude okpu ọchịchị nke Miss Nigeria na 1957. Oyelude si na ugwu ndị Hausa, n’agbanyeghi na ndi be ya bụ Yoruba[2]. Sukai nọgidere na mba ahụ afọ ole na ole mgbe ọ chịchara, tupu ọ laghachi Europe, ma debanye aha na Paris Academy of Fashion, ebe ọ mụrụ akwụkwọ ejiji na akụkọ ihe mere eme.[3]

Na 2008, Sukai mụrụ nwa nwaanyị aha ya bụ Zara Chloe. Ọ kwuru na ya achọghị ịlụ nna nwa ya nwaanyị, n’ihi na ụjọ na-atụ ya na ọ ga-agba ya alụkwaghịm.[4] Sukai emeela ọtụtụ ngosi na ngosipụta ejiji na Naijiria, ebe ọ na-abụkarị onye ọka ikpe; ụfọdụ n'ime ndị a gụnyere Runways Dreamz na 2007, na asọmpi nke Young Designers Creative Design na 2009.[5][6]

Na 2009, Sukai kwuputara atụmatụ ya ịmalite ihe ngosi nke Face of Peace. N'ajụjụ ọnụ o kwuru na, "Afrika ma Naịjirịa karịsịa, ahụla usoro esemokwu agbụrụ na okpukperechi nke chụpụrụ ezinụlọ n'oge na-adịbeghị anya, kụtụ ụlọ ma mebie ngwwahia ndi mmadu. . . Ọ dị mkpa igbochi ihe ndi ahụ mere, ihe isi ike ma belata mmebi ma ọ bụ gbasaa, kpaliri ụdị echiche a pụrụ iche na nke mbụ iji kwado ihe na-ebute udo na Nigeria ma Afrika na ebe ndị ọzọ." Agbanyeghị n'ihi amaghị ihe a ka gosibe ihe ngosi ahụ.[7][8][9]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]