Biyi Afonja

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Biyi Afonja
Biyi Afonja
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1935 Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan Dezie

 

Amụrụ Biiyi Afonja bụ onye ọka mmụta ma bụrụ kwa onye Naijiria n'afọ 1935 . Ọ lara ezumike ọrụ oyibo na ọkwa prọfesọ nke Statistics na Ngalaba n'akuzi Statistics na Mahadum Ibadan .[1] Ọ bụ onye Naijiria mbụ ịbụ Onye isi oche nke African Statistical Association.[2]

Agụmakwụkwọ ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọ malitere njem agụmakwụkwọ ya n'ụlọ akwụkwọ All Saints' School, nke dị na Araromi Orita tupu ogafee na Government College, Ibadan maka ịgụ akwụkwọ sekọndrị ya.[3] Agụmakwụkwọ ya n'ụlọ akwụkwọ dị elu kpọgara ya na Mahadum College, Ibadan (nke a n'akpọzị ugbua Mahadum Ibadan dị na Naịjirịa) o nwetere nzere Bsc. na mgbakọ na mwepụ na Mahadum Aberdeen, Scotland nweta kwa Diploma na Statistics na Mahadum nke Wisconsin, USA nweta kwa nzere ukwuu PhD na ọnụ ọgụgụ.

Ọrụ ọha na eze na ugo ndị etunyere ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọ rụkwara ọrụ na ọnọdụ ukwuu dị iche iche dị ka Onye isi, Ngalaba nke Statistics na Mahadum Ibadan, Kọmishọna n'ahụ maka Mmụta na oge gara aga na mpaghara odida anyanwu Western State of Nigeria. Omechara bụrụ kwa onye isi oche National Advisory Council on Statistics, bụrụ kwa onye isi oche Governing Council nke Ogun State College of Education na Pro-Chancellor nke Mahadum Ogun State nke ana akpọzi Olabisi Onabanjo University Ago Iwoye Ugbua.[4][5]

Ebe msi dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Suleiman. Nigeria: When Prof. Afonja Celebrates His 70th Birthday. All Africa. Retrieved on 17 April 2019.
  2. Nigerian Statistical Association. www.nsang.org. Archived from the original on 2019-03-16. Retrieved on 2019-04-17.
  3. Afonja (2005). In His Hands: The Autobiography of a Nigerian Village Boy (in en). STATCO. ISBN 9789783313460. 
  4. Admin (2016-08-26). AFONJA, Prof Biyi (en-US). Biographical Legacy and Research Foundation. Retrieved on 2019-04-17.
  5. Biyi Afonja (1950) Clocks 82, launches a book titled "I SMELL A RAT: A Pro-Chancellor's Adventure in University Governance" | GCI Museum. www.gcimuseum.org. Retrieved on 2019-04-17.