Bjerknes Center for Climate Research

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Bjerknes Centre for Climate Research bụ ụlọ ọrụ nyocha ihu igwe na Bergen, Norway. Ebe ndị dị mkpa nke nyocha bụ mgbanwe okike na usoro ụwa na mgbanwe ihu igwe nke mmadụ mere. Ụlọ ọrụ ahụ na-ejikọta ihe ndị a hụrụ na ihe ọmụmụ nke ógé gara-aga, ugbu a na ọdịnihu. A na-amụ ma mpaghara Global na Polar.

A malitere ụlọ ọrụ ahụ n'afọ 2000 ma bụrụ mmekọrịta dị n'etiti Mahadum Bergen, Institute of Marine Research, Nansen Environmental and Remote Sensing Center na NORCE (nke bụbu Uni Research). Ụlọ ọrụ ahụ bụ akụkụ nke Research Council of Norway's Centre of Excellence program site n'afo 2003 ruo 2013. Eystein Jansen duziri ụlọ ọrụ ahụ site n'afo 2000 ruo 2013, mgbè nke ahụ gasịrị Tore Furevik bụ ónyé nduzi.

Ndị nchọpụta sitere na Bjerknes Centre esonyewo na Intergovernmental Panel on Climate Change assessment reports; Eystein Jansen dị ka otu n'ime ndị édémédé na akụkọ nke anọ. Asgeir Sorteberg na Special Report on management the risks of extreme events and ọdachi to advance climate change adaptation (SREX). Eystein Jansen, Peter Thorne na Christoph Heinze abụwo ndị isi edemede na ónyé nchịkọta nyocha na IPCC Working Group mbụ, màkà IPCC Fifth Assessment Report.[1]

A na-akpọ ya aha Vilhelm Bjerknes na nwa ya nwoke Jacob Bjerkne, bụ ndị méré ọtụtụ ihe iji chọta omume nke ógè a nke ịkọ ọdịnihu ihu igwe.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]