Gaa na ọdịnaya

Blaoui Houari

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Blaoui Houari
mmádu
Ụdịekerenwoke Dezie
Mba o sịAlgeria, France Dezie
Aha enyereHouari Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya23 Jenụwarị 1926 Dezie
Ebe ọmụmụOran Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya19 Julaị 2017 Dezie
Ebe ọ nwụrụOran Dezie
Ụdị ọnwụeke na-akpata Dezie
Ihe kpatara ọnwụmyocardial infarction Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụsinger-songwriter Dezie
Oge ọrụ ya (mmalite)1940 Dezie
Ngwa egwuJita Dezie

Blaoui Houari (23 J

3Jenụwarị 1926 na 19 Julaị 2017) bụ onye Algeria na-agụ egwu, na-ede egwu na onye nduzi. N'oge ọrụ ya, o dekọrọ ihe karịrnarị itoolugwu 900 ma wepụta ihe otu narị rị 100 abọm.

Mmalite ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Blaoui Houari na 23 Jenụwarị 1926 na Oran, Western Algeria, mgbe ahụ French Algeria.[1][1][2] Nna ya, onye nwere ụlọ mmanya na Oran, na-akpọ Kwitra.[1] Houari hapụrụ ụlọ akwụkwọ mgbe ọ dị afọ iri na atọ iji rụọ ọrụ maka nna ya.[1]

Houari malitere ọrụ ya dị ka onye na-agụ egwú na onye na-ede egwú n'afọ 1940, mgbe mbụ ọ kụrụ egwu na agbamakwụkwọ na emume ibi úgwù.[2] O dekwara egwu ma kpọọ piano, guitar, mandolin na accordion.[2] O weputara abọm mbụ ya n'afọ 1955, nke gụnyere egwu Benyekhlef Boutaleb bụ Rani Mīhayer .[1] N'afọ 1986, o wepụtara Dikrayat Wahran, abọm banyere Oran.[1] N'oge ọrụ ya, o dekọrọ ihe karịrị egwu narị itoolu ma wepụta ihe karịrị otu narị abụọ.[2]

Ya na Ahmed Wahby, Houari guzobere El Asri, ụdị egwu nke jikọtara egwu ọdịnala Arab na rhythm Bedouin na asụsụ Oranian.[2][3] Dịka ọmụmaatụ, ọ gbanwere uri Abdelkader El-Khaldi ka ọ bụrụ abụ.[2]

N'oge Agha Algeria, ndị agha France jidere Houari ma jide ya na Sig maka abụ ya na-akwado Algeria.[1][4] Mgbe Algeria ghọrọ mba nwere onwe ya na 1962, ọ ghọrọ onye isi nke ụlọ ọrụ redio na telivishọn ọha na eze nke Oran.[1] N'afọ 1970, ọ duziri ndị Algeria National Orchestra na Expo '70 na Osaka, Japan.[2]

Ọnwụ na ihe nketa

[dezie | dezie ebe o si]

Houari nwụrụ na 19 Julaị 2017 na Oran, mgbe ọ dị afọ iri itoolu na otu.[2][1][3] E liri ya na ili ozu Ain El Beida nke Oran.[1][3]

A na-ewere Houari dị ka "onye bu ụzọ egwu raï".[5] N'ezie, egwu ya metụtara ọtụtụ ndị na-eme ihe nkiri raï, gụnyere Khaled, onye kpuchiri ụfọdụ egwu ya, yana Houari Benchenet na Cheb Mami.[2][6][1]

Ebensidee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 Hamidouche. "Décès de Blaoui El Houari, une légende de la chanson oranaise", L'Humanité, 19 July 2017. Retrieved on 19 July 2017.
  2. 1 2 3 4 5 6 7 8 9 "Décès de Blaoui Houari, un géant de la musique algérienne", La Dépêche du Midi, 19 July 2017. Retrieved on 19 July 2017.
  3. 1 2 3 "Algérie : décès du chanteur Blaoui El Houari, icône de la chanson oranaise", Jeune Afrique, 19 July 2017. Retrieved on 19 July 2017.
  4. (2008) in Cloonan: Popular Music Censorship in Africa. Aldershot, U.K.: Ashgate. ISBN 9780754652915. OCLC 254419692. 
  5. Al-Deen (May 2005). "The Evolution of Rai Music". Journal of Black Studies 35 (5). DOI:10.1177/0021934704273906. 
  6. Bensignor (2009). "Khaled : Liberté". Hommes & Migrations 1278 (1278): 250–255. DOI:10.4000/hommesmigrations.268. Retrieved on 20 July 2017.