Célia Posser

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Célia Posser
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSão Tomé and Príncipe Dezie
Aha enyereCélia Dezie
Ebe ọmụmụSão Tomé and Príncipe Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Célia Posser bụ onye ọka iwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na São Tomé na Príncipe . Ọ rụrụ ọrụ na kọmitii nke Praịm Minista Maria do Carmo Silveira n'etiti afọ 2005 ruo afọ 2006 dị ka odeakwụkwọ nke steeti maka nchịkwa ọha na eze na nkwukọrịta ọha na eze. Mgbe ọ hapụsịrị gọọmentị, ọ nọgidere na mba ahụ iji gaa n'ihu na-arụ ọrụ dị ka onye ọka iwu ma họpụta ya ka ọ bụrụ onye isi nke otu ndị ọkàiwu mba n'ọnwa Machị 2017.

Célia Posser jere ozi dị ka odeakwụkwọ nke steeti maka nchịkwa ọha na eze na nkwukọrịta mmekọrịta n'etiti afọ 2005 ruo afọ 2006 na Gọọmentị Iwu nke X nke São Tomé na Príncipe n'okpuru Praịm Minista Maria do Carmo Silveira.[1] N'oge ọ nọ n'ọchịchị, ọ malitere ịnye ụlọ ọrụ redio na telivishọn nke gọọmentị ma nyekwa akwụkwọ ikike mgbasa ozi redio abụọ mbụ nke mba ahụ.[2] Posser bụkwa onye nnọchi anya São Tomé na Príncipe na mkparịta ụka 2005 ya na Angola iji melite mmekorita na nchekwa, njem, ịkụ azụ na nkwukọrịta na iji kwurịta mgbaghara nke $ 21 nde ụgwọ a ji Angola.[3] Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye isi oche nke Supreme Press Council nke agwaetiti ahụ (onye na-ahụ maka mgbasa ozi).[4]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. A situacao das mulheres na sociedade santomse (pt). Federal University of Rio Grande do Sul. Archived from the original on 19 August 2017. Retrieved on 11 November 2017.
  2. "Governo vai reestruturar rádio estatal face à liberalização do sector", Noticias Lusofonas, 21 February 2006. Retrieved on 11 November 2017. (in pt-PT)
  3. "São Tomé e Príncipe quer perdão da dívida de USD 21 milhões", ANGOP, 28 November 2005. Retrieved on 11 November 2017. (in PT-PT)
  4. Annuaire des Instances Francophones de Régulation de la Communication (fr). Réseau Francophone des Régulateurs des Médias. Archived from the original on 2012-06-17.