COVID-19 na ọrịa kansa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

[1][2]ọrịa kansa bụ otu n'ime ọrịa ndị na-eme ka ihe ize ndụ nke COVID-19 na-etolite na ọrịa siri ike.

Ihe ize ndụ nke ọrịa siri ike[dezie | dezie ebe o si]

[3]Ndị NHS nke Unaited Kingdom adọla aka ná ntị na ndị na-aga ọgwụgwọ ọgwụ ma ọ bụ radiotherapy maka Ọrịa kansa akpa ume na ndị nwere Ọrịa kansa ọkpụkpụ nwere ike ibute ọrịa siri ike ma ọ bụrụ na ha ebute ọrịa COVID-19. [4] [5]Na Sweden, a chọpụtara na ndị nwetara ọgwụgwọ ọgwụ n'oge na-adịbeghị anya nọ n'ihe ize ndụ dị elu maka ịrịa ọrịa siri ike na-esote ọrịa COVID-19.

Ịtụ Aro[dezie | dezie ebe o si]

Uropian Sosaịtị nke Medikal Onkoloji (ESMO) na-atụ aro na ndị na-ahụ maka ọrịa kansa kwesịrị ịdị njikere ịgbanwe usoro ọgwụgwọ ha n'ihi ọrịa COVID-19. Ntuziaka maka iji ọrụ Telemedicine, belata nleta ụlọ ọgwụ, ịgbanwe Ọgwụgwọ intravenos na ọgwụgwọ subkutanos ma ọ bụ nke ọnụ, mgbe o kwere omume. ESMO [6]-na_atụkwa aro inye ndị ọrịa ndụmọdụ gbasara ịchịkwa ọrịa.

NHS [4] England na-ekwusi ike na mkpebi ndị ọrịa ọbụla ga-eme site n' ìgwè ndị ọkachamara dị iche iche.Ndi NHS eguzobewokwa otu n[4] dị mkpa maka ndị na-anata ọgwụgwọ ọrịa kansa nke mere na ndị nwere ohere dị elu nke ịga nke ọma ga-ebute ụzọ maka ọgwụgwọ karịa ndị ọzọ.

Uropian sosaịtị [7] Sojikal Onkoloji na-adụ ọdụ megide ịhụ ndị ọrịa kansa karịrị afọ iri asaa n'ụlọ ọgwụ, ọ gwụla ma ọ dị ngwa.

Ogologo oge Ọrịa COVID-19[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ọrịa COVID-19 na-agbake n'ime izu abụọ rue isii nke mmalite nke mgbaàmà, ụfọdụ na-enwe mgbaàmà ndị na-abịa ma na-aga ma a gasia ọtụtụ ọnwa. [8] ike ịkọwa, mana ọ dị mkpa ka a nyochaa ya, na ndị ọrịa nwere COVID-19 ogologo oge nwere ike ibute ọrịa kansa akpa ume.

Ebe e siri deputa[dezie | dezie ebe o si]

  1. COVID-19 och cancer. www.internetmedicin.se. Retrieved on 13 May 2020.
  2. (January 2021) "Viral Immunity and Vaccines in Hematologic Malignancies: Implications for COVID-19.". Blood Cancer Discovery 2 (1): 9–12. DOI:10.1158/2643-3230.BCD-20-0177. PMID 34604788. 
  3. Clinical guide for the management of noncoronavirus patients requiring acute treatment: Cancer. Archived from the original on 29 July 2020. Retrieved on 13 May 2020.
  4. 4.0 4.1 4.2 Burki (1 May 2020). "Cancer guidelines during the COVID-19 pandemic" (in en). The Lancet Oncology 21 (5): 629–630. DOI:10.1016/S1470-2045(20)30217-5. ISSN 1470-2045. PMID 32247319.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "lancetoncology" defined multiple times with different content
  5. Förekomst och utfall av covid-19 hos personer med cancer (sv). Swedish National Board of Health and Welfare (2020-06-17). Retrieved on 2022-04-02.
  6. Cancer Care During the COVID-19 Pandemic: An ESMO Guide for Patients. www.esmo.org. Retrieved on 13 May 2020.
  7. ESSO Statement on COVID-19 :: ESSO. www.essoweb.org. Archived from the original on 5 November 2020. Retrieved on 13 May 2020.
  8. Saini (June 2021). "Cancer as a prospective sequela of long COVID-19". BioEssays: News and Reviews in Molecular, Cellular and Developmental Biology 43 (6): e2000331. DOI:10.1002/bies.202000331. PMID 33914346.