Chadian–Nigerian War

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chadian–Nigerian War
agha
ebeȮra Borno, Lac Region Dezie
oge omeluEprel 1983 Dezie
oge obidoro1983 Dezie
oge ngwụcha1983 Dezie
victim1000 Dezie

 

Agha nke Chad na Naijiria bụ agha dị mkpirikpi na nke na-adịghị ahụ mgbe nile bụ nke a lụrụ maka ịchịkwa agwaetiti dị na ọdọ Chad . Agha a bidoro mgbe ike nke onye isi ndị ọrụ nchekwa nke ndị agha Chad bụ Idriss Déby wakporo akụkụ ụfọdụ nke Borno Steeti, wee kwụsị na mgbe ndị agha Naịjirịa nke Muhammadu Buhari chụpụrụ ndị Chad ma wakpoo mpaghara ndị Chadi oge dị mkpirikpi. [1]

Agha ahụ[dezie | dezie ebe o si]

Agha a mere n’oge ọgbaghara Chad na Libya, nwa obere oge ka Chad nwesịrị agha obodo nke ndị nchekwa udo Naịjirịa chọtara onwe ha n’ọgbọ agha. Ọgbaghara ọzọ jikọrọ mmekọrịta Chad na Naijirịa bụ esemokwu mpaghara dị n'akụkụ Ọdọ Mmiri Chad, bụ nke butere esemokwu nke oge dị anya.

N'abalị iri na-asatọ nke ọnwa Eprel afọ 1983, ndị agha Chad wakporo ma weghara agwaetiti iri na itoolu na Ọdọ Mmiri Chad. N'ịrụ ọrụ na-abụghị nke gọọmentị Naịjirịa, Muhammadu Buhari, onye isi ndị isi (GOC) nke ngalaba agha nke atọ nke Jos, [2] mechiri ókèala Chad na Naijiria wee chịkọta ndị agha ya. Gọọmentị Naịjirịa n'okpuru Onye isi ala Shehu Shagari nyere iwu ka Buhari mepee ókèala, mana ọ jụrụ n'ihu ọha, họrọ ịchụpụ ndị agha Chadi na-enweghị ngọzi ndị gọọmentị. Ndị agha Naịjirịa weghachitere agwaetiti ndị ahụ nke gara nke ọma, ma chụọ ndị Chadi kilomita iri ise n'ofe okeala. [3]

Nsonaazụ[dezie | dezie ebe o si]

Agha a bụ otu n’ime ihe butere igba okpuru ọchịchị Naịjirịa n’afọ 1983 . Igosiputa enweghi ike nke onye isi ochichi Shagari na ndi isi oru ya nile, nke nyere Buhari aka ime ihe megide iwu ya, o gosiputara nsogbu di n’etiti ndi agha na ndi ochichi gọọmenti nkịtị. Ka ọnwa Decemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na otu n’afọ 1983, Muhammadu Buhari weghaara ọchịchị n’obodo Naịjirịa, wee mechie Second Nigerian Republic . [3]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Akinsanya (2013). An Introduction to Political Science in Nigeria. John Adebunmi Ayoade. ISBN 978-0-7618-5743-3. 
  2. Matthews, Martin P. Nigeria: current issues and historical background. p. 121.
  3. 3.0 3.1 Omoigui. HISTORY OF CIVIL-MILITARY RELATIONS IN NIGERIA (5)*: THE SECOND TRANSITION (1979-83, Part 2)*. Gamji. Retrieved on 19 January 2015.