Chaxiraxi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Foto nke Virgin nke Candelaria (Onye Nlekọta nke Canary Islands) na Basilica nke candelariya (Tenerife).

Chaxiraxi bụ chi nwanyị, nke a maara dịka Nne Anyanwụ, n'okpukpe nke ndị Guanche bi na Canary Islands. Chaxiraxi bụ otu n'ime chi nwanyị ndị isi nke pantheon Guanche. E jikọtara ya na kpakpando Canopus.

Dịka e kwenyere na ụmụ amaala nke Canary Islands bụ ndị Berber tupu mmepeanya, a na-eche na Chaxiraxi nwere ike ịbụ nke sitere na chi nwanyị Punic-Berber Tanit, e nyere aha dị iche na njirimara. Ụfọdụ na-ejikọkwa ya na ọdịdị a n'ihe dị ka 1392, 1400 maọbụ 1401 nke Virgin nke Candelaria na Güímar, n'àgwàetiti Tenerife, bu nwa ya, Chijoraji.

Okpukpe nke oge a[dezie | dezie ebe o si]

A na-ewere Chaxiraxi dị ka chi nwanyị bụ isi nke okpukpe ọhụrụ na Chọọchị nke ndị Guanche.

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]