Cheb Nasro

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Cheb Nasro
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịAlgeria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Novemba 1969 Dezie
Ebe ọmụmụAïn Témouchent Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, omee Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1987 Dezie
ngwa egwusynthesizer, olu egwụ Dezie
ụdịraï Dezie
akara ndekọRotana Music Group Dezie
onye nlereranyaMessaoud Bellemou Dezie
Cheb Nasro
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịAlgeria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Novemba 1969 Dezie
Ebe ọmụmụAïn Témouchent Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, omee Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1987 Dezie
ngwa egwusynthesizer, olu egwụ Dezie
ụdịraï Dezie
akara ndekọRotana Music Group Dezie
onye nlereranyaMessaoud Bellemou Dezie

Nasereddine Souïdi (Arabic: الدينيدي سو, amụrụ na 30 Nọvemba 1969), nke a maara dị ka Cheb Nasro na Nasro bụ onye na-agu egwu raï kachasị mma onye nwere ihe karịrị abọm otu narị na iri atọ na otu.[1][2][3] Nasro edekọla egwu nke gụnyere "Ndirek Amour" (M na-ahọrọ gị Ịhụnanya m) "Ma Rkhalinich" (Ahapụla M) na "Enfin Enfin" (n'ikpeazụ). Ọ bụ naanị onye na-agu egwu Raï bịanyere aka na ụlọ ọrụ egwu America, Miles Copeland ARK21/Mondo Melodia.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nasro Nasereddine Souidi na 30 Nọvemba 1969 na Aïn Témouchent o wee too n'obodo ọdịda anyanwụ Algeria nke Oran.[4] Oge izizi ya na egwu bịara mgbe ọ dị afọ abụọ mgbe nwanne nna ya zụtara ya drabouka (ịgba omenala). Mgbe ọ bụ nwata, ọ na-esokarị Cheb Zahounie agbamakwụkwọ na-eme ka ọ pụta ìhè mbụ mgbe ọ dị afọ iri na asaa na ụlọ ọgbakọ Nasro dị n'ógbè ahụ nwetara nkwanye ùgwù ma kpọọ ya òkù ka ọ bụrụ ihe ngosi kwa ụbọchị site na elekere nke ato nke ụtụtụ ruo elekere nke anọ na ụlọ oriri na ọṅụṅụ. N'ime otu afọ, o dekọrọ abọm mbụ ya wee malite ịrụ ọrụ na Europe dum. N'agbanyeghị asọmpi, Nasro na Cheb Hasni ghọrọ ezigbo enyi. Olileanya nke Nasro n'oge ọrụ malitere ịla n'iyi mgbe e gbuchara Cheb Hasni na September 29, 1994, mgbe ọtụtụ ndị na-agu egwu raï kwagara Europe ma ọ bụ North America, ọ bụ otu n'ime mmadụ ole na ole gara n'ihu na-abụ abụ n'ala nna ya. O mechara kwuo, sị: “Enwere m anụ ahụ́ nke ukwuu n’ihi nchegbu wee na-agagharị ọtụtụ ebe"

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Cheb Nasro. Play Google.
  2. Cheb Nasro. Skyrock. Rabah Mezouane (6 January 2013).
  3. Présentation de Cheb Nasro. All for Music.
  4. Cheb Nasro. Retrieved on September 24, 2012.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]