Chidinma and Chidiebere Aneke

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chidinma and Chidiebere Aneke
identical twins
Chidinma and Chidiebere Aneke
Chidinma and Chidiebere Aneke
identical twins

Afọ ọmụmụ ha: Amụrụ Chidinma na Chidiebere Aneke n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọgọọstị, n'afọ 1986(afọ iri atọ na isii)

Steeti ha: Enugu, Enugu State, Nigeria

Akaọrụ ha: Ndị na-eme ihe nkiri, Ndị na-emepụta ihe nkiri.

Chidinma na Chidiebere Aneke bụ ụmụ ejima enwere n'ụlọ ọrụ Nollywood, ndị ama ama dịka ejima Aneke. A mụrụ ha na ndịda nke Nigeria, steeti Enugwu kpọmkwem. Ọ bụ ha bụ ụmụ ikpeazụ nye ezinụlọ Aneke. Ha bụ ndị na-eme ihe nkiri na ndị na-emepụta ihe nkiri

A mụrụ Chidinmma na Chidiebere n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọọstị1986 na steeti Enugu, Nigeria n'ime ezinaụlọ ụbara nke nwere ndị nwunye atọ. Ha nwere nna bara ọgaranya nke lekọtara ha anya nke ọma mana ihe gbanwere mgbe nna ha nwụsịrị na e kewara ihe onwunwe ya n'etiti ndị ezinụlọ ha. Ha nwetara asambodo iha akwụkwọ praịmarị na nke ụlọ akwụkwọ sekọndịrị na steeti Enugwu. Mgbe ha gụsịrị akwụkwọ praịmarị na sekọndrị, Chidinma na Chidiebere gara Mahadum nke Nigeria, Nsuka ebe ha gụsịrị akwụkwọ na Bachelor na Mass Communication na Bachelor na Banking na Finance n'otu n'otu.

Ụmụ ejima Aneke sonyeere ụlọ ọrụ Nollywood na 1999 ebe ha so wee mepụta ihe nkiri 'Ebuka' nke bụ ihe nkiri mbụ ha. Ihe nkiri 'Ebuka' nyere ha ezi ọnụdọ na Nollywood. N'afọ 2004, ụmụ ejima Aneke bụụrụ ndị ama ama n'ihe nkiri aha ya bụ 'Desperate Twins' nke mere ka ha nweta nhọpụta maka Ọrụ Kachasị Mma nke Nlele Anya na Onyinye Nleta Ndị Anwansi nke Africa. Ha emeela ihe karịrị fim iri asatọ. Ha emepụtala ọtụtụ ihe nkiri Nollywood dịka; 'Obi Isiaku', 'Onochie', 'Broken Ambition' na 'Adaora '.

Ndị Enyi Na-ekwo ekworo

Ụmụ ejima na-achọsi ihe ike

Ụmụ nwanyị Lagos

Ntiwasị Oke ọchịchọ

Ntụrụ ugo[dezie | dezie ebe o si]

Onyinye inyere mmadụ aka [1]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. "The Aneke Twins Steal The Show As They Bag Humanitarian Award In US", Nigerian Celebrity News + Latest Entertainment News, 2016-09-27. (in en-US)