Chinese Girl

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chinese Girl
painting
Oge/afọ mmalite1952, 1953 Dezie
ụdịportrait Dezie
Onye nchepụtaVladimir Tretchikoff Dezie
Ihe ejị mee yaoil paint, canvas Dezie
depictsnwanyị Dezie
nchịkọtaunknown value Dezie

Àtụ:Infobox Artwork Nwa nwanyị China (nke a na -akpọkarị The Green Lady ) bụ ihe osise Vladimir Tretchikoff mere n'afọ otu puku narị iteghete na iri ise na abụọ (1952). Mbipụta arụpụtara nke ukwuu n'ime afọ ndị sochirinụ so na ahịa kacha ere na narị afọ nke iri abụọ. [1] Ihe osise a bụ nke nwa agbọghọ China n'ihi ọ bụ a mara ya nke ọma maka ụcha akpụkpọ anụ ahụ na-adịghị ahụkebe ma bụrụ nke pụrụ iche na nke ibe bụ nke ejiri see ihu ya bụ ụcha na achaba n'anya bụ ucha agbugba akwụkwọ ndụ, nke nyere eserese ahụ aha ya na-ewu ewu ma bụrụ eserese ama ama nke bụ The Green Lady . Ọ bụ ezie na Tretchikoff kwusiri ike na ebibiela ụdị mbụ nke eserese a na Cape Town na ọ sere ụdị nke ọhụrụ n'oge njem ya n'afọ otu puku narị iteghete na iri ise na atọ (1953 )na USA, ndị nchọpụta ahụghị ihe akaebe ma ọ bụ nke gosiri na ọ bụ eziokwu ọ bụla na nkwupụta a. [1]

E rere ihe mbụ esere ọnụ ego pụtara puku Yuro iteghete na iri asatọ na abụọ na iri ise(£ 982,050) na ụlọ nrepu ma ọ bụ ụlọ mkpọwa ahịa achọ irepu ọsọ bụ Bonhams na London ka ọnwa Maachị gbara mkpụrụ ụbọchị iri abụọ n'afọ Puku abụọ na iri atọ (2013). Ọ bụ onye ọchụnta ego ndị Britain bụ Laurence Graff zụrụ ya. [2] Kemgbe ọnwa iri na otu n'afọ bụ Nọvemba gbara ụbọchị iri atọ n'otu afọ ahụ, e gosila ya n'ihu ọha na Esteti Delaire Graff dị nso na Stellenbosch, South Africa. [3] Ihe nkiri ụfọdụ nke ihe nkiri Alfred Hitchcock Frenzy nke afọ otu puku narị iteghete na iri asaa na abụọ (1972) gosiri ihe osise nke ihe nlereanya Monika Sing-Lee nke Tretchikoff dere, gụnyere nke a. A na -ejikwa foto ahụ dị ka mkpuchi ihu maka albọm Slap nke afọ ndị gbakwunyere afọ1990. site na otu egwu Britain Chumbawamba .

Nlereanya[dezie | dezie ebe o si]

Monika Sing-Lee dị ihe dị ka afọ iri abụọ n'oge ahụ, ma nwee ụfọdụ agbụrụ ndị Europe. [4] ejikwa aha ebe ọ lụrụ di ya bụ aha ọlụlú ya bụ, Pon-Su-San makwaara ya, Tretchikoff zutere ya, na aro nke onye na-agba egwu Russia Masha Arsenyeva, mgbe ọ na-arụ ọrụ n'ulo ọrụ akwa nwanne nna ya nwoke na Cape Town, South Africa. [4] Pon-Su-San nwụrụ na Johannesburg mgbe ọnwa isii bụ Jun gbara mkpụrụ ụbọchị iri na anọ (June 14, 2017).

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Jaketị na -acha uhie uhie
  • Alicia Markova "Onye na -anwụ anwụ"

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

https://web.archive.org/web/20170718090255/https://www.graffdiamonds.com/archives/tretchikoffs-chinese-girl-unveiled-at-delaire-graff-https://web.archive.org/web/20170718090255/https://www.graffdiamonds.com/archives/tretchikoffs-chinese-girl-unveiled-at-delaire-graff-estate//

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Boris Gorelik (2013). Incredible Tretchikoff. Art / Books. ISBN 978-1-908970-08-4. 
  2. Archived copy. Archived from the original on 2018-05-14. Retrieved on 2018-04-22.
  3. Tretchikoff’s Chinese Girl Unveiled at Delaire Graff Estate. Graff Diamonds press release, 29 November 2013. Archived from the original on 18 July 2017. Retrieved on 1 December 2013.
  4. 4.0 4.1 Face to face with the woman who is Tretchi's Chinese Girl. Mail & Guardian, 20 May 2011. Retrieved on 25 January 2014.