Christine Apolot

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Christine Apolot
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Christine Apolot bụ onye nkuzi na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Uganda. Ọ bụ onye ndụmọdụ mpaghara ise(LC5) oche maka Kumi District. A họpụtara ya n'ọkwa ahụ n'ọnwa June 2016. N'afọ 2021, ọ gbara ọsọ dị ka onye nnọchi anya ụmụ nwanyị nke Kumi District n'okpuru National Resistance Movement party na-ama Amoding Monicah aka.[1][2][3]

Amụrụ Apolot na Kumi District. O nwetara akara ugo mmụta mbụ na agụmakwụkwọ na Mahadum Kumi . O nwekwara asambodo na iwu nchịkwa site na Law Development Centre(LDC). Ka ọ na-erule n'ọnwa Machị 2021, ọ na-agbaso akara ugo mmụta na nchịkwa ọha na eze na Uganda Management Institute(UMI).[4]

Apolot malitere ọrụ ya dị ka onye nkuzi ụlọ akwụkwọ sekọndrị, mgbe ahụ ọ sonyeere ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'afọ 2016 n'okpuru National Resistance Movement(NRM) dị ka onye isi oche nke Local Council 5 (LC5) na Kumi District. Ọ bụghị naanị na ọ ghọrọ nwanyị mbụ nọrọ n'oche na mpaghara teso kamakwa otu n'ime ụmụ nwanyị atọ na mba ahụ ghọrọ ndị isi oche LC5 na Uganda. Ugbu a ọ bụ onye nnọchi anya ụmụ nwanyị nke ụlọ omebe iwu a họpụtara maka Kumi District na ụlọ omebeiwu nke iri na otu nke Uganda.[5][6]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 27 April 2021. Retrieved on 14 March 2021.
  2. Reporter (19 January 2021). Full List of Elected MPs in Uganda 2021 (en-US). Daily Express Uganda. Retrieved on 13 March 2021.
  3. Independent (27 January 2021). Court dismisses Kumi Woman MP vote recount application (en-US). The Independent Uganda. Retrieved on 13 March 2021.
  4. Championing exemplary leadership has earned Apolot recognition (en). Daily Monitor. Retrieved on 13 March 2021.
  5. Full List: All 529 Members Of The 11th Parliament (en-US). Thecapitaltimes. Retrieved on 13 March 2021.
  6. Championing exemplary leadership has earned Apolot recognition (en). Daily Monitor. Retrieved on 23 March 2021.