Climate Action Afịrịka

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Climate Action Africa
Formation July 14, 2021 (2021-07-14)
Founded at Lagos, Nigeria
Key people
Chukwuemeka Fred Agbata

Oluchi Grace

Climate Action Africa nke a na-akpọkarị CMA n'aha ịchafụ bụ òtù na-eguzogide ihu igwe nke isi ụlọ ọrụ ha dị na GRA Ikeja, Lagos. Ọ bụ Oluchi Grace na Chukwuemeka Fred Agbata guzobere ya na n'abalị anọ nke ọnwa Julaị afọ 2021. Ọ na-enye ikpo okwu maka ịmara ihu igwe na ihe onwunwe data iji kwado iwu ndi ehiwere gbasara isiokwu ndị nwere ihe ngosi akaebe na-adabere na ihu igwe n'Afrịka[1]

Climate Action Africa sonyere na Africa Climate Summit nke afọ 2023 site na abalị anọ ruo n'abalị isii nke ọnwa Septemba, afọ 2023 emere na Kenyatta International Convention Centre (KICC) na Nairobi Kenya.Ebe Mgbakọ Mba Nile nke Kenyatta Nairobi[2][3] Ọ bụ ihe amaara na omume ihu igwe na-emetụta akụkụ ọbụla nke ndụ ma na-akpata mmebi nke gburugburu ebe obibi. Ya mere, n'akụkọ ụwa nke UN gbasara mgbanwe Ihu Igwe nke ọnwa Septemba 2023 gosipụtara Africa Climate Week 2023 (ACW) na-elekwasị anya na atụmatụ iweta ụ́sà ọkachasị gafee kọntinent Afrịka.[4][5]

Mbido ya[dezie | dezie ebe o si]

Climate Action Africa malitere ọrụ kpọmkwem n'ọnwa Julaị afọ 2021 site n'aka Oluchi Grace na Chukwuemeka Fred Agbata na 53 Oladipo Bateye Street, G.R.A. Ikeja, Lagos dịka ọgbakọ n'ahụ maka ịkwalite usoro mmalite gbasara ihu igwe gbadoro ụkwụ na Teknụzụ na Afrịka.[6] A na-ekwu na usoro omume Ihe ya na-adabere na ntinye aka nke ndị sitere na obodo gbasara ihe ọmụma dị n'efu site n'iweta ederede dị iche iche n'efu, akụkọ ihe ndị mere eme gasị, ihe ndị eserese eji agbasa ozi, vidiyo, na ngwaọrụ mmekọrịta. A na-ekwu na a maara ha maka inye akwụkwọ ndị dịnụ banyere mmata na ihe ọmụma miri emi banyere nsogbu ihu igwe nye ndị na-eme iwu, obodo gasị, ndị metụtara, ndị mmadụ n'otu n'otu, na òtù ọha na eze ndị na-eme iwu ụlọ ọrụ ọha na eze. A na-asụgharị nchọpụta ndị emere site na nnyocha maka ndị ụlọ ọrụ teknụzụ ihu igwe na ndị na-amalite amalite maka iji ya mee ihe n'ụzọ na-enwe ihe nlụpụta n'iweta ụ́sà na-adigide adịgide nye ihu igwe. A maara na ha na-ekwusi ike banyere ike dị ọcha, ọrụ ugbo na-adịgide adịgide, na teknụzụ gasị ndị na-agaghị eweta ọghọm nye gburugburu ebe obibi.[1][7]

Climate Action Africa bụ otu n'ime ebe ọhụrụ na-emepụta ihe na-eme n'Africa ma mee ka ngwọta ya pụta ìhè karịa ndị ọhụrụ 50 na-akpata nsogbu ihu igwe na obodo ndị Afrịka. A maara CMA na ọ na-enye ohere n'efu maka inweta akụrụngwa dị iche iche karịrị puku abụọ n'ọnụ ọgụ gbasara ọmụma ihu igwe n'usoro nakwa isi mmalite dị iche iche. A na-ekwu na isi mmalite ndị a dị iche iche dị n'efu, bụ ndị ezigbo ya, bụrụkwa nke na-emetụ eziokwu kpọmkwem emetụtala ihe karịrị mmadụ puku iri[1]

Climate Action Africa, Ụlọ Ime Gosi maka Nchọpụta (CMA Labs)[dezie | dezie ebe o si]

E mepụtara ụlọ ime gosi maka nchọpụta nke Climate Action Africa(CMA Labs) iji kwadoo usoro mmalite nke teknụzụ ihu igwe n'Africa, mepụta ihe ọhụrụ n'elu mmetụta obodo dị iche iche, yana ntụziaka anụ ahụ nakwa nke ịntanetị, ịnye ego, nlekota na iso n'azụ maka ọzụzụ.[8] Nke a emeela ka mmekọrịta ya na ndị na-eme nchọpụta, ndị ọkachamara n'ihe gbasara nsogbu ihu igwe, ndị ọkà mmụta sayensị, nakwa gọọmentị yana ndị mmekọ nọ n'ala anyị na ndị si mba ụwa ndị ọzọ dị ìrè, na-eru ihe karịrị mmadụ puku ise ndị a kwadoro maka na ha lekwasịrị anya na ihu igwe. Ọzọkwa, akụkọ na-ekwu na "Akụkọ Partech State of Tech na Africa 2022 gosipụtara na ngalaba teknụzụ ihu igwe nwetara ego dị nde dọla narị asatọ na iri isii na atọ". O yiri ka ọ bụ ya bụ obute-ụzọ na-akpali ndị na-eme ihe n'ụwa niile na ngalaba ihu igwe ka ha mee ka ihu igwe dị mma na Africa.[7][9]

A ga-echeta na kọntinent Afrịka ahụla ọtụtụ ihe ịma aka nye mgbanwe ihu igwe. N'ala Naijiria, e nweela usoro ịkpa ike nke idei mmiri site n'afọ 2012. Akụkọ United Nations nke afọ 2023 banyere ihu igwe Naijiria kwuru na "n'ime afọ 2022 naanị, idei mmiri gburu opekata mpe mmadụ narị isii na iri isii na abụọ, merụọ mmadụ dị puku atọ, otu narị na iri asaa na anọ ahụ, chụpụ ihe dị ka nde mmadụ abụọ na ụma site n'ebe obibi ha, ma bibie ụlọ dị puku narị abụọ n'ọnụ ọgụ". Enweela mmetụta ihu igwe na ngalaba ọrụ ugbo, gburugburu ebe obibi, azụmaahịa dị iche iche, nakwa ọdịmma nke ndị mmadụ.[10][11] Ọzọkwa, akụkọ nke Premium Times kwuru na 'ihe otiti ihu igwe na-emetụta Afrịka na ụwa pụtara ìhè na ihe omume ihu igwe na'agbanwe agbanwe (mmụba / obere mmiri ozuzo, idei mmiri, ụkọ mmiri ozuzo, osimiri ikpo ọkụ na-okpomọkụ na akarị akarị, n'etiti ndị ọzọ) nke na-emebi usoro nri, na azụmaahịa ma na-akpata mmebi na ndụ na ụzọ ndụ.[12]

Ikekwe nke a bụ ihe kpatara na United Nations kpọrọ gọọmentị, azụmaahịa, ego, ndị ọchịchị obodo, na ọha mmadụ dị iche iche ka ha zaghachi karịa nye nsogbu ihu igwe maka akụ na ụba na-adịgide adịgide n'ihe nke ha kpọrọ "Ụwa na-ekiri - na mbara ala enweghị ike ichere".[13][14]

Emume gasị nke Climate Action Africa[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Septemba 2023, Chukwuemeka Fred Agbata kwupụtara nsonye nke òtù CMA na ọgbakọ Africa Climate Summit 2023. Nke a mere na Kenyatta International Convention Centre (KICC) na Nairobi, Kenya, site na Septemba 4 ruo na 6, 2023. Nzukọ ahụ kpatara Nkwupụta Nairobi nke lekwasịrị anya na ihe ịma aka nke mgbanwe ihu igwe n'Afrịka. Ndị isi mba ụwa, gọọmentị, nakwa ndị na-eme iwu dị iche iche sonyere na nzukọ ahụ. Na ọgbakọ ahụ, Grace Oluchi kwuru, "Dịka anyị na-amalite njem a, ka anyị cheta na omume anyị niile taa ga-ekpebi ụwa anyị na-ahapụrụ ọgbọ ndị na-abịa n'ihu." Ọ na-aghọzi ihe dị oke mkpa ịrụ ọrụ iji zọpụta mbara ala anyị n'aka mmebi nke ihu igwe na-eweta.[15][16]

CMA ejikọọla aka ọnụ ịrụ ọrụ ya na òtù teknụzụ na ogige dị iche iche ndị gụnyere Creative Space Startups, ISN Hubs, Techbuild, AfriLabs, Founder Institute, na Growth4Her. A makwaara na ya na òtù Njikọ Ọbá Akwụkwọ Naịjirịa (ngalaba Anambra State) na Our Lady Queen of Nigeria Catholic Church enweela ihe omume ha jikọrọ aka ọnụ mee.[1]

Ebe m si Dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Ovat (2023-10-01). Climate Action Africa continues impressive strides toward resilient continent (en-GB). Tribune Online. Retrieved on 2023-10-03.
  2. Ovat (2023-09-09). Climate Action Africa reiterates mission to ensure resilience on continent (en-GB). Tribune Online. Retrieved on 2023-10-03.
  3. African Union Climate Action Innovators Hub: Call for applications | African Union. au.int. Retrieved on 2023-10-03.
  4. UN Climate Press Release (2023-08-09). Africa Climate Week demonstrates continent’s determination to lead on climate action. unfccnews. Archived from the original on 2023-10-09. Retrieved on 2023-03-10.
  5. Africa Climate Week & Summit 2023 | Global Adaptation Network (GAN). www.unep.org. Retrieved on 2023-10-03.
  6. Nigeria (2023-08-07). Group launches climate-tech startup labs against flooding, others (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News. Retrieved on 2023-10-03.
  7. 7.0 7.1 Climate Action Africa Launches CMA Labs to Support Tech Startups – THISDAYLIVE. www.thisdaylive.com. Retrieved on 2023-10-03.
  8. Ikpoto (2023-07-30). CMA unveils climate-tech startup lab (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2023-10-03.
  9. Uroko (2023-07-28). Climate change: New effort at mitigating impact focuses on data, research (en-US). Businessday NG. Retrieved on 2023-10-03.
  10. Nigeria prioritizes climate action to mitigate natural disasters (en). Africa Renewal (2023-09-06). Retrieved on 2023-10-03.
  11. Anselm A. Enete and Taofeeq A. Amusa, “ (2010). "Challenges of Agricultural Adaptation to Climate Change in Nigeria: a Synthesis from the Literature". Journal of Fields Action: Field Actions Science Reports [Online] 4. 
  12. Mojeed (2023-09-04). ANALYSIS: Why Africa is hosting climate summit ahead of COP28 (en-GB). Premium Times Nigeria. Retrieved on 2023-10-03.
  13. Taking the pulse of the planet as the world gathers at the UN (en). Africa Renewal (2023-09-13). Retrieved on 2023-10-03.
  14. The Climate Summit: Ambition, Credibility, and Implementation (en-US). International Peace Institute (2023-07-27). Retrieved on 2023-10-03.
  15. Global Warming (en). Saving Earth | Encyclopedia Britannica. Retrieved on 2023-10-03.
  16. Newstral.com (2023-09-09). tribuneonlineng.com: "Climate Action Africa reiterates mission to ensure resilience on continent" (en). Newstral. Retrieved on 2023-10-03.