Collete Nwadike

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Collete Nwadike
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Eprel 1991 Dezie
Ebe ọmụmụMakurdi Dezie
Ọrụ ọ na-arụmodel Dezie
webụsaịtịhttp://colletenwadike.com/ Dezie

Collette Nwadike (a mụrụ n'6 Eprel n'afọ 1991 bụ onye ngosi ihe nlere anya uwe nke Naijiria, eze nwanyị nma na onye na-eme ihe nkiri na Nollywood. Ọ nọchitere anya Naịjirịa n' Exquisite Face of the Universe Pageant na Sao Tome were pụta onye mmeri, bụrụ onye Afrịka mbụ mere nke a. [1] [2] N'afọ 2014. Ọ bụkwa onye mmeri nke Miss Tourism nke Naijiria. Otu ọnwa o merichara makwa mee njem nkwanye ugwu, e mere ya S.A nke Gọvanọ nke Anambra Steeti bụ Chief Willie Obiano. Ọ bụ onye nnọchianya nke akara Miss Tourism Nigeria.

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Collette n'ụbọchị nke 6 n'Eprel afọ 1991 na Makurdi,dị na Benue Steeti, n'ezinụlọ Maazị na Oriakụ Simon na Angelina Nwadike. [3] O nwere ụmụnne nwanyị ise na nwanne nwoke ma bụrụkwa nwa nwanyị ikpeazụ na nwa nke abụọ. N’agbanyeghi na ọ bụ nwaafọ Nise di na Awka -South Local Government Area, n'Anambra Steeti, Nwadike tolitere na Makurdi n’etiti Naijiria, ebe ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke junịọ sekọndịrị tupu ya agaa Legos iji mechaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya.

N'ajụjụ ọnụ ya na Nwadike kwuru, o kwuru, sị: "Dịka nwata nwanyị na-etolite etolite, a na-ahụkarị onwe m dịka eze nwanyị mara mma mgbe m dị afọ atọ. A nọ m na-elekwasị ndị dị ka Bianca Odumegwu-Ojukwu, Regina Askia-Williams anya . A hụrụ m otú ha si maa mma na otú ha si a muke. E chere m ị dị ka ndị a otu ụbọchị! Nke a bụ nrọ m rọgoro ogologo oge. Ọ dịkwa ka m na-ebi nrọ m ugbu a. " Ọbụnadị ka nwatakịrị, o nwere ọchịchọ nke ịbụ eze nwanyị mara mma ; a kpọrọ ya adaeze n’etiti ndị ezi na ụlọ na ndị enyi ya. O nyeere ya aka n'afọ 2001 mgbe o lechara Agbani Darego, . 

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Collette gara God's Heritage Nursery and Primary School, Makurdi,na Benue Steeti (1993-1995) na Holy Ghost Nursery and Primary School, Makurdi,na Benue Steeti n'afọ 2000. O mechara gaa Anglican Secondary School, Makurdi, Benue Steeti site n'afọ 2001 ruo afọ 2006, were gụchaa O'Level na Caro Secondary School, Olodi-Apapa, Legos Steeti . Mgbe ọ gbara afọ iri na isii n’afọ 2007, a nabatara ya na mahadum nke Nnamdị Azikiwe dị n’Awka ebe ọ gụrụ asụsụ bekee na agụmagụ n’okpuru prọfesọ Joy Chinwe Eyisi na Rems Umeasiegbu dịka ndị nkuzi a ma ama.

N'ajụjụ ọnụ Collette Nwadike banyere kọọsụ ọ gụrụ na mahadum, o kwuru, sị, "E nwetara fọọmụ ya na onwe m, m were denye Asụsụ Bekee na Agụmagụ n'oge mbụ, ma mgbe enyeghị m ya, m nwetara fọọmụ ọzọ ma denyekwa kọọsụ ahụ nke ugboro abụọ. Mmasị m nwere n’asụsụ Bekee bụ n’agụmagụ n'ezie. E nwere m mmasị n'ịgụ akwụkwọ,nke ahụ bụ otu n'ime ihe mere m ji gaa ị gụ kọọsụ a. E nwere m mmasị na akwụkwọ agụmagụ ndị Naijiria. " [4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ngosi uwe na pajentịrị[dezie | dezie ebe o si]

Tupu Nwadike a bụrụ eze nwanyị mara mma, ọ gụpụtala ma sonye n'asọmpi ụdị dị iche iche ma gosipụta ya n'ọtụtụ ihe ngosi uwe. Ọ na-arụ ọrụ, ya na ụfọdụ ndị ọkachamara a maara ọfụma n'eyimeyi na ndị staịlisti na Naijiria. Nwadike e kpebiela ọtụtụ asọmpi ị ma nma, ya na asọmpi eyimeyi na ngosi uwe gụnyere Miss Tourism Nigeria 2015 na Mr. Universe Nigeria 2015.

Collette Nwadike e sonyela n’asọmpi ị ma mma dị iche iche dịka Miss Global Nigeria na Miss Earth Nigeria, ebe ọ bụ onye osote. N'afọ 2014,e kpuwere Nwadike okpu mmeri Miss Tourism Nigeria, e mere n'ọnwa Mee na Legos Steeti, na Naijiria . Ọ nọchitere anya Anambra steeti, n’ime ndị asọmpị iri atọ na ise ndị ọzọ na-anọchite steeti ha. Mgbe e mechara nyocha, e nyere Nwadike okpu mmeri n’abalị ahụ; anya ya juputara na anya mmiri nke obi uto. [5] [6] Otu ọnwa ka e kpnyechara ya okpu mmeri Miss Tourism nke afọ 2015, ọ gara njem nkwanye ugwu i leta Gọvanọ nke Anambra Steeti bụ Chief Willie Obiano . Ha gagharịrị na steeti i ji hụ ebe nlegharị anya dị iche iche. Na nleta ya, akpọpụtara ya ị bụ Onye ndumodu Gọvanọ maka njem. Kemgbe ahụ, Nwadike na-arụ ọrụ na Gọọmentị Steeti gụnyekwa ọrụ ọzọ ọ na-arụ.

N'ọnwa Disemba afọ 2015, ọ nọchitere anya Naịjirịa na Exquisite Face of the Universe nke e mere na Sao Tome and Principe, nke metụtara ihe karịrị ndị asọmpi iri ise sitere mba dị iche iche nke ụwa. O meriri were nweta okpueze nke mere ka ọ bụrụ nwanyị ojii mbụ meriri n'asọmpi ahụ. [7]

Ị me ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Ya na ndị ome ihe nkiri ochie na Nollywood arụkọọla ọrụ, dị ka Obi Emelonye, Ikechukwu Onyenka, Kasvid Movies, SimonPeaceMaker, Ndave David Njoku dgz. Ọ bụ onye isi ụlọ ọrụ nke Screen Goddess Global Productions ma nwee ọganihu na usoro ihe nkiri ya bụ African Beauty nke e gosipụtabeghi na ihe onyonyo [8]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Ihe nkiri Igwe onyonyo
Aha Onye nrụpụta Onyentuziaka
The Calabash Obi Emelonye
Single's Diary Crey Ahanonu Simon Udo
African Beauty Collette Nwadike / Ndave Njoku Ikechukwu Onyenka
Ihe nkiri
Aha Onye nrụpụta Onyentuziaka
Royal Mission Chijioke Nneji of Magic Movies Caz Chidiebere
Chase Simon Udo
O42 Caz Chidiebere
Vidio egwu
Aha Ndị ọgụegwu Onyentuziaka
Bonny and Clyde Percy ft Solidstar Unlimited LA

Ndaghachi azụ na ihe ịga nke ọma[dezie | dezie ebe o si]

Dịka nwata,ọtụtụ ndị ngosi uwe mara mma na ndị na-eme ihe nkiri nwere uwe mara mma na-amasị ya. Ọ gara maka asọmpi ịma mma nke izizi ya ebe ọ sonyere na 2010 Miss National Association of Students of English and Literary Studies (NASELS), Unizik Chapter, mana ọ dara. Mgbe ahụ, ọ nọ n'afọ mbụ ya na mahadum . Ọ gara n’ihu ịzọ ọkwa Miss (UNIZIK) Mahadum nke Nnamdi Azikiwe ma daa. O chere maka ị nwale asọmpi na-bụghị asọmpi ụlọ akwụkwọ were gaa Most Beautiful Girl in Nigeria (MBGN), mana ọ dị mwute na ọ gafeghị nnyocha ahụ. O gafere nnyocha nke Port Harcourt mana ọ kwụsịrị na nke Legos . Mana ọ daghachighị azụ, ọ gara Miss Earth Nigeria, ebe ọ banyere n'ogige ha dị na Lekki,na Legos ma mee nke ọma n'ogige ahụ n'agbanyeghị na ọ pụtaghị otu n'ime ndị meriri n'ikeazụ. E mere mmemme a na "Incubator". E nyere ya nrite Miss Earth Photogenic. Ọsọ ya ịbụ eze nwanyị mara mma gara n'ihu n'afọ 2012 mgbe ọ zọrọ asọmpi Miss Global Nigeria. Nkwado nke nne ya gbara ya ume,o were chọpụta na ọ pụghị ị kwụsị, ị chọ i weta obi ụtọ na i me ka nrọ ya bịa na mmezu. Ọ zọrọ ọkwa Most Beautiful Girl in Abuja were pụta onye nke atọ n'afọ 2013. N’afọ 2014,ọ hụrụ ihe omume Miss Tourism nke Naịjirịa na ntanetị. Ọ gara nnyocha n'Owerri,nke Imo Steeti . Ọ nọchitere anya Anambra steeti. E mere ihe omume a n'ụbọchị nke 17 n'ọnwa Mee nke afọ 2014 ma mee ya na Ruby Gardens. [9]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nigerian Collette Nwadike wins Exquisite Face of the Universe 2015 beauty pageant in São Tomé
  2. the great pageant community The great pageant Community 24 December 2015
  3. Why I felt intimidated when I saw other girls –Collette Nwadike. Archived from the original on 2016-02-26. Retrieved on 2020-11-10.
  4. Interview with Collette by mynewswatchtimesng retrieved June 28 2014. Archived from the original on 2016-02-26. Retrieved on 2020-11-10.
  5. Collette Nwadike, 23-Year-Old Winner Of Miss Tourism Nigeria 2014 Releases Promo Photos. Archived from the original on 2020-11-11. Retrieved on 2020-11-10.
  6. MEET MISS TOURISM NIGERIA 2014 COLLETE NWADIKE
  7. she emerged winner EFOU. Archived from the original on 2016-06-23. Retrieved on 2020-11-10.
  8. screengoddessglobalproductions.com. Archived from the original on 2016-11-27. Retrieved on 2020-11-10.
  9. The News watch times with Collete Nwadike in an interview