Cornelia O'Dwyer

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Cornelia O'Dwyer
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereCornelia Dezie
Ebe ọmụmụSan Francisco Dezie
Cornelia O'Dwyer

Cornelia O'Dwyer (a muru n'afọ 1984) bu onye nhazi Talk Show, onye edemede, onye isi nrụpụta na onye okike ihe ngosi vidiyo onye bi na Legos,nke Naijiria, ma n'obodo New York. Ọ bụ onye nhazi ihe ngosi mkparịtaụka nke Ndani TV nke a kpọrọ Ndani Real Talk, na onye bụbu onye na-ahazi ihe omume ụtụtụ nke Smooth 98.1 FM nke a kpọrọ Grapevine 981. Ọ bụkwa onye ọdee akwụkwọ nke Today's Woman Magazine (TW). Cornelia bụ onye nhazi na onye isi nrụpụta nke Talk Show Chick Chat Live na Fox Life Africa a na-egosi na DSTV, Startimes, na Kwese TV na gburugburu Sahara Afrịka . Ọ bụkwa Onye isi okike nke Carmarcon Media. [1] [2] [3] [4]

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Cornelia na San Francisco, were zụlite na Naijiria. N’afọ 1998, ọ hapụrụ Naịjirịa gawa Ingland mgbe ọ dị afọ iri na anọ mgbe nne ya nwụrụ n’ihe mgbawa gaas. N'afọ 2005, o nwetara nzere bachelọ nke nka (BA) na ihe nkiri, omenaala na agụm akwụkwọ mgbasa ozi sna Mahadum nke West nke England na Bristol. Mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na otu, ọ kwagara obodo New York, ebe ọ rụrụ ọrụ ihe dị ka afọ asaa tupu ọ laghachite Naịjirịa n’afọ 2011. [1] [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Cornelia bụbu onye enyemaka ndị isi na Morgan Stanley, na nnukwu obodo New York site n'afọ 2005 ruo afọ 2008. Ọ gara AIG, n'obodo New York n'afọ 2008 dị ka onye enyemaka ndị isi na onye nnyocha ọghọm, ebe ọ na-achịkwa akụkụ nke AIG na-ahụ maka ọghọm na inshooransi. Ọ gakwara rụọ na Citi,n'obodo New York dị ka ọkachamara na nchịkwa ego,n'afọ 2011. Cornelia laghachiri Naịjirịa ma sonyere Bestman Games dị ka onye njikwa mmepe azụmaahịa na onye enyemaka onye isi ọrụ (CEO), n'ọnwa Nọvemba afọ 2012. Mgbe ọ nọ n'ọnọdụ a, ọ ghọọrọ onye njikwa kampeenu na TRACE n'ọnwa Septemba n'afọ 2014. Ọrụ Cornelia dị ka onye njikwa mmepe azụmaahịa na onye njikwa kampeenu kwụsịrị n'ọnwa Septemba afọ 2015 na Nọvemba afọ 2015 n'otu. N’afọ 2015, ọ ghọọrọ onye nhazi ihe omume nke Ndani TV a kpọrọ "Real Talk". [5]

# NDANIREALTALK-S1E7-IHE ỤmỤ NWOKE CHỌRỌ

N'afọ 2017, ọ malitere Chick Chat Live TV Show na mmekorita ya na DZRPT TV na otu 5ive Music. [6] Ihe nkiri ahụ gosiri na Fox Africa . [7]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]