Daisy W. Okocha

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Daisy W. Okocha
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereDaisy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Jenụwarị 1951 Dezie
Ebe ọmụmụObia/Akpor Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye òká ikpe Dezie

Daisy Wotube Okocha (amụrụ ya na ụbochi ịrị na ịse na ọnwa Jenụwarị na afọ 1951) o gara ozi dị ka onye isi ikpe nke asaa nke Rivers Steeti, na-elekọta Ụlọikpe Kasị Elu nke steeti ahụ, na Ụlọ Ọrụ Ikpe.[1] Gọvanọ Ezenwo Wike họpụtara ya na ụlọ ọrụ na 4 Jenụwarị na afọ 2016, ọ nọkwa na oche ahụ ruo mgbe ọ lara ezumike ọrụ na Jenụwarụ 15 n'afọ 2016.[2][3] Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye ịsị ịkpe na ikike ime ihe tupu ọ nweta nhọpụta dị mkpa.[4][5]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Okocha na ubochi ịri na ịse na ọnwa Jenụwarị n'afọ 1951 na Obio-Akpor, Rivers Steeti, Naijiria. Ọ bụ onye ebo Ikwerre. Nna ya, Jonathan Okocha, bụbu kọmishọna ndị uwe ojii, nne ya, Helen Nonyelum Okocha, bụ onye na-esi nri ọha.

Daisy natara LL ya.B. (Hons.) site na Mahadum nke Zaria n'afo 1978. N'afọ ọzọ, na ubochi ịr abuọ na ịteghete na ọnwa June, a nabatara ya n'ụlọ ikpe. O nwekwara diplọma post-graduate na nkà mmụta okpupere, nke ọ gbasoro na Redeemed Christian Bible College (RCBC).[6]

Ọrụ ikpe[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1981, Okocha sonyeere ndị ọka ikpe na obodo ya bụ Rivers Steeti. Ọ malitere ịlụ ọrụ dị ka onye oka ikpe nke mbu na-aga n'ihu n'ọkwa ụlọ ikpe dị iche iche. N'afọ 1991, a họpụtara ya n'ụlọ ikpe dị elu, ọ rụkwara ọrụ dị ka onye isi ikpe na ngalaba Port Harcourt.[6]

A họpụtara ya iji nochie Iche Ndu dị ka onye isi ikpe n'afọ 2013. Ọ bụ ezie na mba ikpe Kansul tụrụ alo ya, gọvanọ Chibuike Amaechi jụrụ ịhọpụta ya. Dị ka o si kwuo, o tozughị oke ịnochi nke ọma CJ lara ezumike nká, kansụl ahụ họpụtara ya maka ọdịmma onwe ya.[7] Na ọnwa June n'afọ 2015, n'okpuru nchịkwa ọhụrụ nke Ezenwo Wike, e dụrụ Okocha n'iyi ọlụ n'ikpeazụ dị ka onye isi ikpe nke Rivers Steeti. Ọ bụ nwanyị mbụ nwere ọnọdụ a, ebe NJC họpụtara ya dị ka onye ọka ikpe kachasị elu n'ụlọ ikpe dị elu.[8]

Okocha bụ onye na-ahụ maka akụ na ụba nke mba otu ụmunwanyi ndi ọka ịkpe na ṅaijiria, onye bụbu onye isi nke mba ụwa nke ụmụ nwanyi ndi ọka ịkpe na Rivers Steeti, onye otu Commonwealth onye ọka ịwu na ndi ikpe' otu, onye otu ugbu a, mba ụwa otu ụmu nwanyi.[6]

Ọnọdụ ndị ọzọ o nwere[dezie | dezie ebe o si]

  • Onye isi majie na-ahụ maka Ụlọikpe Ụmụaka ruo afọ atọ
  • Onye odeakwụkwọ gara aga, onye isi oche gara aga nke otu ndi ọka ịkpe nke Naijiria
  • Onye na eso onye isi ala gara aga nke otu ndi oka ịkpenke ṅaijiria

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta ndị si Rivers Steeti
  • Onye isi ikpe nke Rivers Steeti
  • Ụlọikpe nke Rivers Steeti

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Chioma (2016-01-05). Rivers gets first female chief judge (en-US). TheNigeriaLawyer. Retrieved on 2020-05-28.
  2. Ihunwo (2016-01-04). Governor Wike Swears In First Female Chief Judge In Rivers State, What She Said (PHOTOS) (en). Legit.ng - Nigeria news.. Retrieved on 2020-05-28.
  3. Amadi. As Justice Okocha Bids Rivers Judiciary Farewell (en-US). Retrieved on 2020-05-28.
  4. "Daisy Okocha Takes Oath As Substantive CJ", The Tide, 4 January 2016. Retrieved on 11 February 2016.
  5. Akujobi Amadi. "As Justice Okocha Bids Rivers Judiciary Farewell", The Tide, 20 January 2016. Retrieved on 11 February 2016.
  6. 6.0 6.1 6.2 Justice Daisy Okocha. Rivers State Judiciary. Archived from the original on 19 September 2014. Retrieved on 3 June 2015.
  7. Onukwugha. "I Hold Nothing Against Okocha – Amaechi", Leadership, 3 October 2014. Retrieved on 3 June 2015.
  8. "Rivers Names Female CJ …As Iche Ndu Retires Next Month", The Tide, 29 July 2013. Retrieved on 3 June 2015.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]