Daniel Attoumou Amicchia
Daniel Attoumou Amicchia (1908-1994) bụ onye Ghana na-ese foto nke biri na Grand-Bassam, Côte d'Ivoire.[1][2][3][4]
Mbido ndụ na ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Amicchia malitere ihe gbasara foto na 1920s. O mechara biri na Grand-Bassam, Côte d'Ivoire na 1948 ebe ọ rụrụ ọrụ ruo 1970.[3] Na Grand-Bassam, ọ nọgidere na-akpọtụrụ ndị Ghana na-asụ Bekee na Côte d'Ivoire bụ ndị ọ na-ese foto nke ukwuu.[1] Ọ rụrụ ọrụ dị ka 'onye ahịa na-eme njem' ma mepụta foto nke ezinụlọ na azụmaahịa.[3] A maghị ọtụtụ ihe banyere ndụ na ọrụ Amicchia n'ihi na ọ nweghị akwụkwọ ndekọ nakwa n'ihi na ezinụlọ ya tụfuru ihe ndekọ ya mgbe ọ nwụsịrị.[3]
Otú ọ dị, onye otu Amicchia bụ Joseph Ernest Kouao, debere ma chekwaa ihe ndị fọdụrụ n'ihe ndekọ nke onye na-ese foto. Revue Noire gosipụtara foto Amicchia na 1991.[1] Mgbe nke ahụ gasịrị, foto ya pụtara n'ọtụtụ ihe ngosi na ọdịda anyanwụ[5]
Ọnwụ
[dezie | dezie ebe o si]Amicchia nwụrụ n'afọ 1994 n'ihi ọrịa kansa.[1]
Ebensidee
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 3 4 "Daniel Amicchia – Photo | Revue Noire". www.revuenoire.com. Retrieved 2022-04-08.
- ↑ "Looking sharp in West Africa". Apollo Magazine (in Bekee ndị America). 2021-08-21. Retrieved 2022-04-08.
- 1 2 3 4 Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ "Daniel Attoumou Amicchia - artist, news & exhibitions - photography-now.com". photography-now.com. Retrieved 2022-04-08.
- ↑ "Paris Photo 2011 : Place of honour for Africa". The Eye of Photography Magazine (in Bekee ndị America). 2011-11-08. Retrieved 2022-04-08.