Datooga language

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Datooga language
asụsụ, modern language
obere ụdị nkeSouthern Nilotic Dezie
mba/obodoTanzania Dezie
ụmụ amaala kaDodoma Region, Mara Region, Singida Region, Tabora Region, Manyara Region Dezie
Ọkwa asụsụ Ethnologue5 Na-etolite Dezie

Datooga (nke bu kwa Datog, Datoga, Taturu, Mang'ati, Tatoga ma ọ bụ Tatog) bụ asụsụ Nilotic ma ọ bụ ụyọkọ olumba nke Ndịda Nilotic. Ndị Datooga nke Nnukwu Mgbawa (Great Rift Valley) nke Tanzania na-asụ ya. A na-ejikwa aha Sukuma Taturu mee ihe mgbe ụfọdụ na Bekee; eweputara aha Swahili Mang'ati sitere na Maasai, ebe ọ pụtara "onye iro". Otú ọ dị, ọ dịghị ka ihe na-akpasu ndị Datooga iwe, ebe ọ bụ na ha nwere mpako n'ịbụ onye iro akụkọ ihe mere eme nke ndị Maasai, Mang'ati bu aha eji mara otu ahụ na Swahili. Na mgbakwunye, ọtụtụ aha agbụrụ na nke olumba ka enwere ike ịchọta maka ndị mmadụ ma ọ bụ asụsụ n'ozuzu.

A na-ekwu na ndị Datooga bụ otu n'ime ndị na-agughi akwụkwọ na Tanzania, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ nweghị agụmakwụkwọ n'asụsụ ahụ; a kọọrọ na agụmakwụkwọ na ala Swahili dị ntakịrị n'obodo ụfọdụ. Otú ọ dị, edere asụsụ Barabaiga na Gisamjanga, a na-arụkwa ọrụ na asụsụ nke Asimjeeg.

Otu ndị[dezie | dezie ebe o si]

Asụsụ olumba dị iche iche zuru nke ọma iji mee ka nghọta sie ike, Blench (2000) depụtara (East Datooga) Datooga nke owuwa anyanwu na Datooga nke ọdịda anyanwụ (West Datooga) dị ka asụsụ dịrị omwe ha. A na-eche na olumba na ebo Datooga asaa kwekọrọ, mana asụsụ Gisamjanga (Kisamajeng, Gisamjang) na Barabaig, na ọmụmaatụ, na ada ka ọtụ asụsụ, a pụkwara iwere ya dị ka otu asụsụ. Olumba ndị ọzọ, nke nwere mkpụrụ okwu ndị ọzọ, bụ Bajuta, Barabayiiga (Barabaig, Barabayga, Barabaik, Barbaig), Asimjeeg (Tsimajeega, Isimijeega), Rootigaanga (Rotigenga, Rotigeenga), Buraadiiga (Buradiga, Bureadiga), Bianjiida (Biyanjiida, Utatu).

Nnyocha asụsụ nke emere na aho 1997 gụnyere data sitere na ụdị Datooga anọ:[1]

  • Bianjida (nke a kachasị pụọ iche)
  • Gisamjanga ( nkea gụnyere Bajuta)
  • Barabaiga
  • Buradiga
  • Asimjeeg
  • Gidang'oodiga (otu ndị ọrụ ha bu ikpụ ihe pụrụ iche)

Nsonaazụ -da (otu) na -ga (ọtụtụ) na aha ndị a na ọtụtụ aha Datooga Yitere asụsụ Bekee pụtara nke.

Ụtọ Olu[dezie | dezie ebe o si]

Asụsụ South Cushitic nke a na-asụbu n'ógbè ebe Datooga weghaara, nke mere na o metụtala Datooga nke ukwuu. Otu a ka Datooga si were mmetụta n'otu dị ike n'asụsụ Iraqw nke n'obu na ọtụtụ mpaghara Datooga mbụ ma mịkọrọ Datooga site na alụmdi na nwunye; dịka ọmụmaatụ, ndị Iraqw na-eji okwu Datooga maka asụsụ uri.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ralph Schubert, Anette Schubert, Douglas Boone & Sheri Daggett, 1997. 'Datooga Dialect Survey', SIL.