Dayo Adedayo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dayo Adedayo
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Julaị 1964 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ, osee foto Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

'Dayo Adedayo (a mụrụ n'ụbọchị nke mbụ n'ọnwa Julaị n'afọ 1964) bụ onye Naịjịrịa azụrụ azụ na Briten. Onye na-ese foto, onye na-ahụ maka ọdịbendị, na onye edemede. Dayo bụ onye dere Nigeria 2.0, akwụkwọ a na-edekọ akụkọ maka ọtụtụ ebe dị mkpa na Nigeria. N'ime afọ iri na asaa, 'Dayo agagharịala ma dekọọ steeti iri atọ na isii na Naịjirịa.[1]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Adedayo gụrụ akwụkwọ praịmarị na Children's Home School, Molete, Ibadan, Oyo State, Nigeria na Moslem Primary School, Idofe, Oke-Ife, Ijebu Ife, Ogun State, Nigeria. Ọ lere ma nweta asambodo ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya na Ijebu Ife Community Grammar School . Ọ gụrụ Photography Arts na Westminster College na University of Westminster, UK. Ọ bụ onye edemede nke Rivers State Our Proud Heritage, Tour Nigeria, na Lagos State, A Visual Portrait .[2] O chebere ihe karịrị nde foto anọ na Naịjirịa.[3]

Paspọtụ e-pọtụ Naịjirịa na-egosi ihe oyiyi Adedayo

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Adedayo malitere dị ka onye na-ese foto mmekọrịta mmadụ na ibe ya, nke mechara bụrụ onye nweere onwe ya maka Ovation Magazine International tupu ọ banye na foto ihe nkiri. Ọ gara ma dekọọ mpaghara ọchịchị ime obodo narị asaa na ịrị asaa na anọ niile dị na Naịjirịa, na-edekọ maka ala, ndị mmadụ, ọdịbendị, ahịhịa, na nri.[4] A na-egosi akara ise foto ya na peeji nke e-Passport nke Naijiria, nakwa na ahụ aja nke ọdụ ụgbọelu mba Lagos na Abuja ma na-achọkwa ahụ aja nke ọtụtụ ụlọ ọrụ ọha na eze mma ma na Nigeria ma na mba ofesi.[5] N'afọ 2014, iji cheta mba Naịjirịa, e nyere ya ọrụ imepụta ihe oyiyi maka otu narị naira nke otu narị afọ nke Naịjịrịa.[6] Ọ bụ onye otu kọmitii nke nwere ọrụ nke ịmepụta foto na usoro ọmụmụ ọrụ pilot maka National Board for Technical Education (NBTE), ụlọ ọrụ na-ahụ maka Nigerian Polytechnics.[7]

Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye dere akwụkwọ iri na anọ gụnyere; Nigeria, Nigeria 2.0, Enchanting Nigeria, Nigeria The Magical, Lagos State - The Centre of Excellence, Ogun State - The Gateway State, Owe Yoruba, Nigerian Tourism Development Corporation - Tourism is Life, Nigerian National Petroleum Corporation 37 Years in Pictures, Rivers State - Our Proud Heritage, Tour Nigeria, Lagos State - A visual Portrait, Owe Yoruba 2.0 na Ogun State - A Visual Portrait.[8][9]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified. guardian.ng. Retrieved on 2020-11-12.
  2. The Editor. Dayo Adedayo: I'm Using Photography to Document Nigeria. ThisDay. Retrieved on 3 July 2019.
  3. Team (2019-09-07). Afripreneur Profile: Dayo Adedayo, The Man Behind The Lens (en-US). Business Africa Online. Retrieved on 2020-11-12.
  4. Adedayo's Nigeria 2.0 explores hidden rich culture (en-US). Vanguard News (2017-04-16). Retrieved on 2020-11-15.
  5. Dayo Adedayo: I'm Using Photography to Document Nigeria (en-US). THISDAYLIVE (2019-06-23). Retrieved on 2020-11-12.
  6. admin (2016-07-30). Dayo Adedayo: I'll Remain a Photographer Until I Die (en-US). THISDAYLIVE. Retrieved on 2020-11-15.
  7. A Photographer's Journey with Dayo Adedayo | Young & Cerebral (en-US). Archived from the original on 2020-11-17. Retrieved on 2020-11-15.
  8. BellaNaija.com (2020-07-30). Òwe Yorùbá – 'A Rescue to the Threatened Yoruba Language' by Dayo Adedayo (en-US). BellaNaija. Retrieved on 2020-11-15.
  9. {{{title}}}. ISBN 9785340422.