Dayo Israel

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dayo Israel
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1986 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

  Temidayo Israel Abdulai (amụrụ na 29 Jenụwarị 1986) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa, onye ọka iwu, na onye ntorobịa nkwado b onye a họpụtara na 26th nke Machị 2022 dị ka onye ndu ndị ntorobịa nke All Progressives Congress .

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Israel ma zụlite ya na Jebba Street, Oyingbo, Ebute-Metta, Lagos n'ime ezinụlọ Abdulai na Olowogbowo na ezinụlọ Banire na Ibita Ofin Lagos Island dị ka nna nna ya bụ Alhaji BS Abdulai onye nwe Oju Ogunle na Mushin, Lagos mgbe ya ebe nwanne nna nna ya nwanyị, Alhaja Sinatu Banire bụ onye Iya Aro nke Lagos. [1] Nna ya nwụrụ mgbe ọ dị afọ 11, nne ya zụlitere ya n'ime mkpọmkpọ nke Lagos Mainland, ebe ọ nọ na-enyere nne ya aka na azụmahịa ya na-erekwa akpụkpọ ụkwụ Africa na uwe n'okporo ụzọ. [2]

Ọ malitere akwụkwọ na Methodist Boys High School, Lagos ma nweta ịgụ akwụkwọ n'efu site n'aka Gọvanọ Lagos steeti bụ Bola Tinubu [3] ka ọ gụọ akwụkwọ ịmụ Iwu na London Metropolitan University n'etiti 2005 na 2009 ma nwetakwa Master's na International Relations site na otu Mahadum ahụ na 2010. [4] [5]

Na 12 ọ malitere otu NGO nke na-edu ụmụaka na Naijiria nke akpọrọ General Action against the Violation of Human and Children's Rights nke a mere e jiri họpụta ya n'ụlọ omebe iwu ụmụaka Naijiria mgbe ọ dị afọ 14 ma o sitere n'ọkwa ahụ ruo osote onye isi oche Senate wee ruo mgbe ọ lara ezumike nká. [6]

Ọ bụ onye isi oche nke Nzukọ Ọchịchị Presidential Summit nke ụmụaka Naijiria nke o jikwara bụrụ onye ndu ndị nọchite anya ụmụaka Naijiria na nnọkọ pụrụ iche nke United Nations na ụmụaka na New York City ma bụrụkwa onye a họpụtara ka ọ bụrụ kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi otu ụbọchị na Lagos steeti na 2003 [7]

Na 2017, Israel kwuputara ọchịchọ ya maka onye isi oche nke Lagos Mainland Local Government, na Lagos n'okpuru ikpo okwu nke All Progressives Congress [8] [9] ma ọ nwetaghi ya n'ihina ndi All Progressives Congress kpebiri iweta nkwekọrịta ndị nwere nkwenye maka ntuli aka ahụ [10] A họpụtara ya dị ka onye na-adịgide adịgide na Lagos State Universal Basic Education Board na 2019 site na Lagos steeti Gọvanọ [11] [12] na n'ime March 2022 ka a họpụtara ya dịka onye isi ntorobịa nke APC site na nhọpụta nke ndi nwere nkwenye. [13]

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Staff (2016-10-01). Humble Beginnings: Dayo Israel on living his dreams as a speaker, philanthropist, diplomat, talk show host... (en-US). Brielle Magazine. Retrieved on 2022-03-27.
  2. 'Why I am in Lagos Mainland race' (en-US). The Nation Newspaper (2016-09-24). Retrieved on 2022-03-27.
  3. Buhari should do more to fight poverty –Dayo Israel (en-US). Punch Newspapers (2016-10-30). Retrieved on 2022-03-27.
  4. Meets New APC Nat'l Youth Leader, Dayo Israel From Lagos (en-US). Towncrier (2022-03-26). Retrieved on 2022-03-27.
  5. Dayo Israel - London Metropolitan University. www.londonmet.ac.uk. Retrieved on 2022-03-27.
  6. "He was at the forefront of the Child Rights Act" | YourCommonwealth (en-GB). www.yourcommonwealth.org (2012-12-06). Retrieved on 2022-03-27.
  7. Dayo Israel: Africa's Award-winning Youth Advocate. (en-GB) (2014-01-15). Retrieved on 2022-03-27.
  8. Emuleomo (2016-08-12). 'I don't need a godfather...' | Dayo Israel on why he is #NotTooYoungToRun » YNaija (en-GB). YNaija. Retrieved on 2022-03-27.
  9. Aspirant seek better deal for Lagos youths during US tour (en-US). The Nation Newspaper (2016-10-25). Retrieved on 2022-03-27.
  10. Aina (2017-06-08). 'This loss hurts' – Dayo Israel speaks on failed attempt at Mainland LG chairmanship (en-US). InsideMainland. Retrieved on 2022-03-27.
  11. Source (2019-09-15). Sanwo-Olu Appoints Alawiye King, Dayo Israel As SUBEB Chairman, Member (en-US). The Source. Retrieved on 2022-03-27.
  12. LASUBEB BOARD COMPOSITION. lasubeb.lg.gov.ng. Retrieved on 2022-03-27.
  13. National youth leader: Lagos APC picks Dayo Israel as consensus candidate (en-US). TheCable (2022-03-26). Retrieved on 2022-03-27.