Dikeledi Direko

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dikeledi Direko
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya28 Eprel 1985 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jimember of the National Assembly of South Africa Dezie
kọwara na URLhttps://www.pa.org.za/person/dikeledi-rosemary-direko/ Dezie

Dikeledi Rosemary Direko (amụrụ n'abalị iri abụọ na asatọ n'ọnwa Eprel n'afọ 1985) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị South Africa si Free State onye jere ozi dị ka onye otu National Assembly of South Africa kemgbe afọ 2019. Direko bụ onye otu African National Congress .

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Direko na 28 Eprel, na afọ 1985.[1] Ọ gụrụ akwụkwọ na Phehello Senior Secondary School. O nwetara Project Management Programme (NQF Level 4) na Health Advance Institute ma nwee diplọma na njikwa mmekọrịta ọha na eze. Direko nọ ugbu a [mgbe?] na-amụ maka diplọma na iwu na nchịkwa gọọmentị ime obodo na Mahadum Fort Hare.[2]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Direko bụ onye otu kọmitii na-ahụ maka ngalaba Sipho Mutsi nke African National Congress Youth League site na afo 2005 ruo na afọ 2008 ma jee ozi dị ka odeakwụkwọ alaka maka otu afọ site na afo 2008 ruo na afọ 2009. Ọ rụkwara ọrụ na kọmitii na-ahụ maka mpaghara Lejweleputswa nke otu ndị ntorobịa nke ANC site na afo 2009 ruo na afọ 2011.[2] Site na afo 2014 ruo afọ 2015, ọ bụ odeakwụkwọ mpaghara nke ANC Youth League.[2]

Na African National Congress, ọ bụ onye otu kọmitii na-ahụ maka alaka nke ANC Sipho Mutsi site na afo 2008 ruo na afy 2011. N'afọ 2011, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote onyeisi oche alaka ma jee ozi ruo n'afọ 2014.[2] A họpụtara Direko ka ọ bụrụ onye otu ANC Lejweleputswa Regional Executive Committee na National Executive Committee nke ANC Youth League n'afọ 2015.[3]

Ọrụ omeiwu[dezie | dezie ebe o si]

Direko guzoro dị ka onye omeiwu ANC site na Free State na ntuli aka 2019 ma mesịa bụrụ onye a họpụtara na National Assembly ma ṅụọ iyi na 22 Mee 2019.[4][5]

Direko bụ onye otu Portfolio Committee on Cooperative Governance na Traditional Affairs.[2]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Here's the full list of politicians who will make up South Africa's 6th Parliament", 15 May 2019. Retrieved on 19 April 2021.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Ms Dikeledi Rosemary Direko. Parliament of South Africa. Retrieved on 19 April 2021.
  3. "The newly elected ANCYL leadership", News24, 6 September 2015. Retrieved on 19 April 2021.
  4. "SEE: These are the people who will represent you in Parliament, provincial legislatures", News24, 15 May 2019. Retrieved on 19 April 2021.
  5. "WHO'S NOMINATED FOR THE NATIONAL ASSEMBLY & PROVINCIAL LEGISLATURES?", EWN, 15 May 2019. Retrieved on 19 April 2021.