Dimi Mint Abba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dimi Mint Abba
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịMauritania Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Disemba 1958 Dezie
Ebe ọmụmụTidjikja Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya4 Jụn 2011 Dezie
Ebe ọ nwụrụRabat Dezie
ihe kpatara ọnwụcerebral hemorrhage Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, odee egwu, Odee akwụkwọ Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1976 Dezie
Oge ọrụ ya (njedebe)2011 Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
akara ndekọWorld Circuit Dezie

Dimi Mint Abba (Arabic; iri abụọ na ise nọwa Disemba 1958 - nọ nwa June 2011) bụ otu n'ime ndị egwu a ma ama na Mauritania.[1][2][3] A mụrụ ya Loula Bint Siddaty Ould Abba na Tidikdja Mauritania na 1958, n'ime ezinụlọ dị ala ("iggawin") bụ ọkachamara na omenala griot.[4]

Ndụ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Nne na nna Dimi bụ ndị na-agụ egwú (a gwara nna ya ka ọ dee abụ mba Mauritania), ọ malitekwara ịkpọ egwu mgbe ọ dị obere. Ọrụ ọkachamara ya malitere na 1976, mgbe ọ bụrụ abụ na redio wee sọọ mpi, n'afọ sochirinụ, na asọmpi Umm Kulthum na Tunis. Egwú mmeri ya "Sawt Elfan" ("Art's Plume") nwere okwu "Art's Feather is a balsam, a weapon and a guide enlightening the spirit of men", nke a nwere ike ịkọwa ka ọ pụtara na ndị na-ese ihe na-arụ ọrụ dị mkpa karịa ndị agha na ọha mmadụ.

Ntọala mbụ ya na mba ụwa bụ na akara ndekọ World Circuit, na-agbaso aro sitere n'aka Ali Farka Touré. Na abọm a, di ya Khalifa Ould Eide na ụmụ ya nwanyị abụọ sonyeere ya.

O mechara dee egwu Mauritania a ma ama na nke a ma ama dị ka "Hailala" na "Koumba bay bay". Ọ nwụrụ na June 4, 2011, na Casablanca, Morocco mgbe ihe mberede mere na Aioun ụbọchị iri tupu mgbe ọ na-abụ abụ maka ọha na eze Sahrawi. Dimi n'oge ndụ ya gara mba Afrịka n'ọtụtụ ebe, Europe na (1989) na (2006) n'otu n'otu, United States (US) na (1993), Australia na (2009).[4]

Nkọwapụta[dezie | dezie ebe o si]

  • Khalifa Ould Eide & Dimi Mint Abba, Moorish Music si Mauritania. World Circuit WCD 019, 1990.
  • Dimi Mint Abba, Music and Songs of Mauritania, Auvidis Ethnic 1992.
  • The Rough Guide to West African Music, World Music Network, 1995
  • Unwired: Africa, World Music Network, 2000

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. Mauritanian traditional singer Dimi Mint Abba dies in Morocco hospital at 52. Associated Press (4 June 2011).
  2. "Dimi Mint Abba: Musician known as 'la diva du désert' and hailed by Ali Farka Touré as Africa's greatest singer", The Independent, 17 June 2011. “Dimi Mint Abba, one of the pre-eminent vocalists to emerge from present-day Mauritania, became the de facto international face of modern Mauritanian music.”
  3. Lost legends. Sauti za Busara Zanzibar - Festival Programme 2012. Busara Promotions (2012). Archived from the original on 2013-07-27. Retrieved on 2022-07-16.
  4. 4.0 4.1 "Dimi Mint Abba | Mauritanian musician and singer", Encyclopedia Britannica. Retrieved on 2018-05-24. (in en)