Dobara (nri ndi Algeria)
Ọdịdị
Dobara bụ ofe nke ndi obodo Algeria na-eri akwụkwọ nri na-atọ ụtọ, nke e ji chickpeas ya na agwa sara mbara mee ma jiri mmanụ oliv mee ka ọ dị mmiri.[1] O sitere n'obodo Biskra di na Algeria, a na-eri ya n'oge oyi n'ebe ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ, ọkachasị na El Oued, Batna, Khenchela, Aïn M'lila, Constantine na Djelfa.[1]
Akụkọ ihe mere eme
[dezie | dezie ebe o si]E kere Dobara tupu mmalite nke esemokwu obodo Algeria, ọ mechara bụrụ nri nke ndị agha Algeria.[2]
Oriri ya sitere na mpaghara Zibans na Aurès ruo na Batna, mgbe ahụ gaa An M'lila na Constantine, yana obodo ndị ọzọ dị na Algeria.[3]
Mgbanwe dị iche iche
[dezie | dezie ebe o si]E nwekwaziri ọtụtụ ụdị dobara: ọkụ maọbụ oyi, ihe ndị e ji mee ya nwere ike ịdịgasị iche dabere na mpaghara.
- 1 2 Accueil (fr-FR). Infosoir.com (2012). Retrieved on 2022-11-07.
- ↑ Doubara, le roi des mets…. Djazairess (2009). Archived from the original on 2022-11-07. Retrieved on 2022-11-07.
- ↑ Une brèche pour la doubara. Djazairess (2009). Retrieved on 2022-11-07.