Dolapo Oni
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Asụsụ Yoruba |
ọrụ ọ na-arụ | oko akuko ihe onyonyo, onye mgbasa ozi |
Ụcha ime anya | black |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ájá ájá |
Dolapo Oni. mgbe ụfọdụ a na-akpọ Marcy Dolapo Oni Audio bụ onye Naijiria na-eme ihe nkiri, onye na-emeputa ihe na TV, onye nduzi na MC.[1][2][3][4]
Oni bụ nwa ikpeazụ n'ime ụmụ anọ n'ezinụlọ ya. Ọ biri afọ iri abuaina United Kingdom tupu ọ laghachi Naịjirịa n'afọ 2010.[4] Mgbe ọ dị afọ iri, ọ chọrọ ịbụ onye na-eme ihe nkiri mgbe ọ hụrụ egwu Andrew Lloyd Webber, Aspects of Love, na The Oxford Playhouse.
Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndrị na Headington School, ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị na-akwụ ụgwọ na Oxford, England, ebe ọ bụ nwa agbọghọ ojii mbụ. Ọ gara Mahadum Bristol ebe ọ nwetara akara ugo mmụta na kemịkal.[4]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Oni malitere ime ihe nkiri mgbe ọ bi na United Kingdom, mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na mahadum, site n'ịga ụlọ akwụkwọ ihe nkiri. Ọ nwetara ebe ọ ga-amụ na Academy of Live and Recorded Arts (ALRA) na Wandsworth, London, ebe ọ rụrụ ọrụ n'ọtụtụ ihe nkiri gụnyere Walking Waterfall nke Nii Ayikwei Parkes, William Shakespeare's A Midsummer Nightńs Dream, In Time nke Bola Agbaje, God is a DJ na Iya-Ile (The First Wife nke Oladipo Agboluaje). O nwetala Dorothy L. Sayers Drama Award.[5]
Oni mere ihe ngosi TV mbụ ya na UK na ọbere usoro BBC Vexed, tupu ọ laghachi Naịjirịa.
Ọrụ mbụ ya bụ na Naịjirịa ọbere ọge ka ọ lọtara, na Studio 53 Extra ebe ọ nọrọ afọ atọ na-amụta banyere ngosi TV na mmepụta. Ọ hapụrụ Studio 53 Extra n'ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n'otu oge ahụ ka ọ hapụrụ Moments na Mo iji malite ihe ngosi nke ya, The Marcy Project .[4]
O gosipụtara na ihe ngosi MNET, 53 Extra (nke bụbu Studio 53 Extra) na Africa Magic, tupu ya esoro Mo na-akwado Moments na Ebony Life TV.[6][5] Ọ pụtara na Diary of a Lagos Girl na Desperate Housewives Africa .[7]
Oni sonyere na ihe ngosi panel You Wanna Get Married na United Kingdom.[8] Ọ bụ onye na-emepụta Diary of a Lagos Girl . Otu n'ime ihe nlereanya ya na ụlọ ọrụ ihe nkiri bụ Mrs. Biola Alabi na Mrs.Bolanle-Austen Peters[4]
Ndụ onwe onye
[dezie | dezie ebe o si]Ọ lụrụ Prince Adegbite Sijuwade na 2 Ọgọst 2015. Ọ mụrụ nwa mbụ ya n'afọ 2017.[9]
Ihe odide
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Alafe. "5 ways to rock black as inspired by Marcy Dolapo Oni", Pulse, 3 March 2020. Retrieved on 6 April 2021.
- ↑ "7 things you probably don't know about talented TV host, actress", Pulse, 19 August 2019. Retrieved on 27 May 2020.
- ↑ "Mum Of The Month – Marcy Dolapo Oni", LagosMums, 20 March 2019. Retrieved on 27 May 2020.
- ↑ 4.0 4.1 4.2 4.3 4.4 "Why I left Moments with Mo – Dolapo Oni-Sijuwade", Punch, 3 April 2016. Retrieved on 27 May 2020.
- ↑ 5.0 5.1 Bilen-Onabanjo. "Princess Charming: Dolapo Oni", The Guardian, 20 August 2016. Retrieved on 27 May 2020.
- ↑ "DOLAPO ONI-SIJUWADE God picked the perfect partner for me", The Nation, 16 October 2016. Retrieved on 27 May 2020.
- ↑ Mercy Dolapo Oni. IMDb. Retrieved on 27 May 2020.
- ↑ "COVER STORY – DOLAPO ONI", Lady Boss, 27 May 2017. Retrieved on 27 May 2020.
- ↑ Oloruni. "Media personality Marcy Dolapo Oni celebrates 4th wedding anniversary with beautiful photos", Legit. Retrieved on 27 May 2020.