Dominic Ongwen

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Dominic Ongwen (a mụrụ n'afọ 1975) bụ onye Uganda bụbu nwata agha na onye bụbu ọchịagha nke otu n'ime ndị briged nke otu ndị agha okpuru nke Ugandan Lọd's Rezistans Amị (LRA).

E jichiri ya n'afọ 2014 [1] na n'afọ 2021 ụlọ ikpe mpụ mba ụwa mara ya ikpe maka mpụ agha na mpụ megide mmadụ, gụnyere igbu ọchụ, ndina n'ike, ịta ahụhụ, na ịgba ohu. [2]

Mmalite ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Dominic Okumu Savio (aha ọmụmụ ya) n'obodo Choorum, Kilak County, Amuru district, Northern Uganda n'ihe dị ka 1975, nwa nwoke nke anọ nke Ronald Owiya na Alexy Acayo, ndị nkuzi abụọ bi na Paibona.[3][4] Nne na nna ya, dị ka ọtụtụ ndị ọzọ nọ na Acoliland n'oge ahụ, nyere ya aha ụgha ma zụọ ya iji ya mee ihe ma ọ bụrụ na a tọọrọ ya, iji chebe ndị ọzọ nọ n'ezinụlọ. [5] a, Ongwen, pụtara "a mụrụ n'oge ndanda ọcha". [1] [3] mechara bụrụ nom de guerre ya.

Ntọrọ[dezie | dezie ebe o si]

Ndị LRA tọọrọ Ongwen ka ọ na-aga ụlọ akwụkwọ praịmarị Abili na Koro. [6] ka mmagba ama nke ya si kwuo, nke a mere na 1988 mgbe ọ dị afọ iri na anọ. Otú osila [5] dị, a na-akọkarị na ọ dị afọ itoolu ma ọ bụ iri, [1] nakwa na ndị ọzọ a dọọrọ n'agha buuru ya gaa n'ụlọ ọrụ ndị agha LRA n'ihi na ọ 'dị obere ịga ije'. [3]

Mgbe nne Ongwen nụrụ na a tọọrọ ya, ọ jụrụ ịgba ọsọ na ndị obodo ndị ọzọ na-ekwu na ọ dị njikere ịlụso ndị nnupụisi ọgụ. [7] Ka ha lọtara, ha hụrụ ya ka ọ nwụrụ anwụ ma mesịa chọta nna ya nwụrụ anwụ. 

Dịka Priveeti Ayị si kwuo, dịka nwatakịrị Ongwen gbalịrị ịgbapụ; mgbe e jidere ya, a manyere ya ka ọ kpụọ otu n'ime ndị ọzọ dị ndụ. [8] oge na-aga, ọ manyere ndị mkpọrọ nwanyị ka ha tie ndị mkpọrọ ndị ọzọ ihe ruo ọnwụ, ọ na-achịkwa ọnwụ site n'ịtụ nkume.

Ozugbo [9] a tọọrọ ya, ọ gara emume mmalite nke gụnyere ịta ahụhụ na ịmanye ya ile emume ime ihe ike nke ndị mmadụ a na-egbu egbu. E mechara zụọ ya n'okpuru nkuzi nke Vincent Otti, mgbe ọ ka bụ nwatakịrị, dị ka onye agha LRA.

Ọ wee bulie n'ọkwa ịbụ majọ mgbe ọ gbara afọ iri na asatọ 18 ma bụrụkwa brigedia nke ndị Sinia briged , otu n'ime LRA briged anọ na ngwụcha afọ iri abụọ ya .[3][10] Ongwen bụ onye otu"kontroolu ọta " nke ndị LRA na_atuzi atụmatụ ndị militri. [Tinye edensibịa][citation needed]

  1. "LRA commander Dominic Ongwen appears before ICC in The Hague", BBC News, 26 January 2015. Retrieved on 21 June 2018.
  2. Ssebwami. "ICC conviction of LRA commander provides overdue justice for victims of decades-long campaign of abuses", UgStandard, 2021-02-05. Retrieved on 2021-02-05.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Dominic Ongwen: born at the time of the white ant, tried by the ICC – By Thijs B. Bouwknegt (en-GB). African Arguments (2015-01-20). Archived from the original on 2020-10-31. Retrieved on 2020-10-25.
  4. LRA Series Part 3: The Story of LRA Commander, Dominic Ongwen. Archived from the original on 2023-12-22. Retrieved on 2024-03-09.
  5. 5.0 5.1 Archived copy. Archived from the original on 2016-03-17. Retrieved on 2016-06-11.
  6. Dominic Ongwen and the Search for Justice. warscapes.com (2 March 2016). Archived from the original on 15 July 2016. Retrieved on 11 June 2016.
  7. Dominic Ongwen: a Tyrant or Victim of Circumstances? (en-GB). Kata Kata (2015-02-15). Archived from the original on 2020-10-28. Retrieved on 2020-10-25.
  8. Private Eye no. 1547, mid-May 2021 , page 22.
  9. Burke. "Child soldier to war criminal: the trial of Dominic Ongwen", The Guardian, 27 March 2016. Retrieved on 11 December 2016.
  10. "Profile: Dominic Ongwen of Uganda's LRA", BBC News, 2015-01-26. Retrieved on 2020-10-25. (in en-GB)