Gaa na ọdịnaya

Done P. Dabale

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Done Peter Dabale nke abalị iri abụo na isii nke ọnwa April 26, 1949 - Ọgọstụ afọ 2006 bụ onye guzobere ụlọ ụka United Methodist na Naijiria UMCN. [1] N'oge ọ bụ bishọpụ, ndị otu nọ na ụlọ ụka ahụ mụbara site na puku iri ruo puku narị anọ.[1]

  • 1967 Nọọsụ asambodo, Numan ụlọ akwụkwọ nke Noosu na Adamawa, Naijiria [2]
  • 1970 asambodo na ezumezu ọrụ ugbo, ụlọ akwụkwọ ọrụ ugbo Gọọmenti na Yola Adamawa Steeti, Naijiria [2]
  • 1974 Diploma na Theology, Theological Kọleji na Bukuru Jos, Naijiria [1]
  • 1980 ọmụmụ anụmanụ Diploma na mba ofesi, Barneveld Kọleji na Netherlands [1]
  • 1980 asambodo na nchịkwa ụlọ ụka, ụlọ akwụkwọ nke Thiolọji Gbarnga na Monrovia, Liberia [1]
  • 1985 asambodo nyocha na ọrụ ugbo na nkà mmụta okpukpe, Mahadum Alabama, USA [1]
  • 1987 Dọkịta nke Diviniti na ụlọ akwụkwọ Theology nke Gbarnga, ụlọ akwụkwọ Theology na Monrovia, Liberia [3]

Ndụ onwe onye

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Dabale na Nyabalang-Yotti, mkpokọta Jereng nke Adamawa Steeti na mba Naijiria.[3] O si n'ezinụlọ nwere ọtụtụ nwanyị. Nne Dabale nwụrụ mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ; mgbe nke ahụ gasịrị, otu n'ime ndị nwunye isii nke nna ya zụlitere ya. Dabale nke okenye bụ onye na-akọ ọdịnihu (mypa) na onye na-ahụ maka ọgwụ, onye dị ka Yotti maọbu ọdịnaala okpukpere Bali si kwuo, e kwenyere na ọ na-anata amamihe ya site n'aka chi na ndị nna nna na-emekọrịta ihe na ndị dị ndụ. Dabale ga-eketa ọnọdụ nna ya; Otú ọ dị, mgbe ọ ka bụ nwa akwụkwọ nọ n'obodo ahụ, Dabale zutere Ndị Kraịst ma gbanwee. Ụfọdụ n'ime ndị ezinụlọ Dabale ka na-ekpe okpukpe nke ndị nna nna ha, na-ebikọ ọnụ na okpukpe ọhụrụ nke Iso Ụzọ Kraịst na Islam. Dabale lụrụ Kerike C. Dabale, onye na-ezisa ozi ọma, onye ọrụ ugbo na onye na-elekọta ezi na ụlọ, ha nwekwara ụmụ iri na otu.[1]

Bishọp mba United Metọdisiti mbụ nke Naijiria, Done Peter Dabale, nwụrụ n'abalị iri abụo na isii nke ọnwa Ọgọstụ na Ụlọ Ọgwụ Metọdist. Ọ dị afọ iri ise na asaa.[4]

  • Nturu ugo nturu ugo nke mba Naijiria – Ahụmụzọ nke nkwudoro mba Afrika afọ 2005 

[ a chọrọ nkọwa ] Iso Ụzọ Kraịst na Naijiria

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 3 4 5 6 7 Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).. umc.org. United Methodist Church. August 27, 2006. Archived from on September 24, 2014. Retrieved September 26, 2014.
  2. 1 2 "Bishop Done Peter Dabale (Nigeria Area), Recipient of the Distinguished Peacemaker Award - Africa". GBGM News Archives. General Board of Global Ministries, The United Methodist Church. Archived from the original on August 30, 2009. Retrieved September 26, 2014.
  3. 1 2 "Bishop Dabale of Nigeria Speaks on "Hope for the Children of Africa"". General Board of Global Ministries, the United Methodist Church. December 2000. Retrieved September 26, 2014.{{cite web}}: CS1 maint: deprecated archival service (link). General Board of Global Ministries, the United Methodist Church. December 2000. Archived from on September 20, 2014. Retrieved September 26, 2014.
  4. ↑ Stephen, Drachler. "UMNS# 511-Done Peter Dabale, church's 1st Nigeria bishop, dies".