Dorathy Nyagh

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dorathy Nyagh
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie

Dorathy Nyagh bụ nwanyị Naijiria na-egwu egwuregwu dị bekee kpọrọ Handball na onye isi nke Benue Queens na otu n'ime ndị egwuregwu edepụtara ịnọchite anya Naịjirịa na African Women's Handball Championship nke weere ọnọdụ na Yaoundé, Cameroon na June 6, 202[1][2]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Dorathy malitere egwuregwu ya akpọrọ "Handball" n'olu bekee mgbe ọ nọ n' ogo akwụkwọ dị nta na 2005 na Queen of the Rosary Secondary School Gboko .[3]. Onye nkuzi ya, Maazị Godwin Tondo nke a na-akpọkarị 'Gordons' na sekọndrị gbara ya ume bụ onye nyeere ya aka inwe mmasị n'ịgba Handball.

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na ụlọakwụkwọ sekọndrị, ọ gara Mahadum Benue State na 2009 ebe ọ gụrụ maka asụsụ bekee wee bụrụ onyeisi nke ụlọakwụkwọ ahụ. Ọ bụ naanị nwa agbọghọ n'ime ụmụ anọ, ndị mụrụ ya kwadoro mmasị ya maka egwuregwu ma nye ya nkwado niile iji nwee ihe ịga nke ọma na ya. Nna Dorathy bụkwa onye egwuregwu. Ọ bụ onye nkuzi na College of Education na Katsina- Ala. ebe ọ na-akụzi na ngalaba nke kinetics mmadụ.[4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Dorathy amalitela igwu egwu ma na-anọchite anya ụlọakwụkwọ ya ebe ọ bụ na ọ nọ na mmemme ụlọ akwụkwọ sekọndrị n'oge egwuregwu ụlọakwụkwọ sekọndrị niile. N'ọnwa Julaị afọ 2018, mgbe ọ gwụsịrị egwu na mbipụta mbụ nke Prudent Energy Handball League, ọ gbara bọọlụ na Civil Defender Babes . N'afọ 2020, ya na ndị otu ya gbara bọọlụ na Prudent Energy Handball League .[5][6] Ọ gbara bọọlụ maka All Africa Games qualifiers. Mgbe ya na ndị otu ya ruru eru, a kpọrọ ha ka ha bịa egwuregwu ahụ. Na Morocco, ọ gbara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ egwuregwu niile. N'afọ 2021, o duru ndị otu ahụ gaa Naịjirịa na Women's Africa Handball Championship nke were ọnọdụ na Yaoundé, Cameroon[7]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Archive copy. Archived from the original on 2022-06-28. Retrieved on 2022-05-16.
  2. Chukwunosike (2021-06-03). Nigeria unveils final team list for Africa Women’s Handball Nations Cup (en-US). TODAY. Retrieved on 2022-05-16.
  3. Dorathy Nyagh: Benue Queens will survive relegation from handball league (en). Daily Trust (2020-11-07). Retrieved on 2022-05-16.
  4. Dorathy Nyagh: Benue Queens will survive relegation from handball league (en). Daily Trust (2020-11-07). Retrieved on 2022-05-16.
  5. Handball: Nyagh Aspires To Be Among Best Players (en-US). aljazirahnews (2020-09-28). Archived from the original on 2021-01-14. Retrieved on 2022-05-16.
  6. Ajayi. "Handball: Nyagh Aspires To Be Among Best Players", Aljazirah Nigeria Newspaper, ,2020-09.
  7. Olaseinde (2021-06-02). 16 players to represent Nigeria in Africa Women Handball Nation’s Cup (en-US). Blueprint Newspapers Limited. Retrieved on 2022-05-16.