Egwu Agbachaekurunwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Egwu Agbachaekurunwa
type of dance
mba/obodoNaijiria Dezie
onye na-eme ihe nkirinwanyị Dezie
nchekwa ngwa égwuịgba, Ekwe, Opi Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo, Ahiazu Mbaise Dezie

Egwu Agbachaekurunwa[1] bụ ihe eji mara ndi Ụmụcho Ụmụediabali Ihitteaforukwu Ahiazu Mbaise n'Imo steeti. A na-agba ya oge ekeresimasi, ọ bụr na mmadụ nwụọ, ikufute nwa, ihe nrisa, na ihe ndi ọzọ dị iche iche. Nwanyị ọbụlà mụrụ nwa n’ụlọ ọgwụ, a na-eburu egwu a ga n’ ụlọ ọgwụ, gaa kuru ya na nwa kutere di ya. Nwanyị na-alụ dị, tolue ịlụ dị, e ji egwu akpọla ya na di

Mana ana-agbakarịcha ya n' ọnwa Nọvemba rue Disemba n' oge afọ ọhuru. ụmụanyị ndị na anọghi n’obodo na-ekwo egwu a kworo otu ọ dị ụtọ n’egwu ọdịnaala  abata n’obodo[2].

A na eji egwu a enye umunwanyi nọ na dị na-eme isi ike ọzụzụ, site na-iri ha nha. Isi ike a bụ ihe ndi di ka izuo ohi, ịkwaa iko, ịtụ asi na imegbu mmadụ. iwu ndị na ejikọlata nwanyị n' obodo. Ya cheta na aga eri ya iwu, ojikọlata onwe ya.

Na igba egwu a, a na eyi uwe elu ụmụnwanyị, na ichafu isi.

Mkpọpụta[dezie | dezie ebe o si]



Ngwa egwu eji Akụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Ngwa egwu eji akụ ya bụ isi ogwe, udu, ọyọ, ogele na ọkwá.

Vidio[dezie | dezie ebe o si]

egwu Agbachaekurunwa








Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:AGBACHAEKURUNWA_DANCE.ogg
  2. AID Project (2023-2-4). Audiovisual of Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-11.