Egwu Atịlọgwụ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Atilogwu
type of dance
obere ụdị nkeite egwu Dezie
omenalaNdị Igbo Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie

Egwu Atịlọgwụ[1] bụ nke ndị Ezeagụ na Ụdị di n’ Enugwu Steeti. Ndị Udị na Ezeagu bụ ihe jikọrọ aka ọnụ wee bido ya bụ egwu n’afọ 1954 [2] E ji ya nabata Queen Elizabeth mgbe izizi ọ bịara n’obodo anyị bụ Naijiria na afọ 1956. N'oge ahụ, egwu etiri bụ ihe ndị mmadụ ahụnubeghi anya. Nke a mere ajụjụ ji daa si ‘etibere egwu a ọgwụ?'Mmadụ dika Ifeanyichukwu Nzekwe, Elias, Felix Okonkwo si Agụobu Iwolo, Ferdinand Anukwe si Ihieoya, na Innocent Ozieze si Iwolo wee jikọọ onwe ha ọnụ pụta n’akụkụ si ná aha egwu a ga bụ Atilọgwụ, nke sitere na ajụjụ ahu ajụrụ si ‘etibere egwu a ọgwụ?. Iji na echete nnabata Queen Elizabeth na ya bụ egwu a agbara mara eji jinye ya na ego 5 naira nke Naijiria na mgbe ahu.

Mgbe gboo, Atilọgwụ bu ụmụnwoke na-agba ya a gba si ya ike. ụmụnwoke na-agba ya mgbe ahụ jikwusie a nụchaa nwaanyị. N’ihe na ụmụnwoke na-agba ya na-eme nke ọma n' egwu, Ụmụnwanyi gbasochara ha agbaso. Mana ugbua, ụmụnwanyị na agbakwazi ya.

O nwere akwa eji mara ya bụ egwu. Akwa éjị nwee mara Egwu Atilogwu bụ akwa na-egbukatu, egbuka nke nwegasiri agwa dịgasị iche iche.

Mkpọpụta[dezie | dezie ebe o si]




Ngwa Egwu Atịlọgwụ[dezie | dezie ebe o si]

Ngwa e ji akụ Atilogwu di ụzọ asaa. Ha bụ Alo, ịgba, obere ịgba, Aligọngọ, ngede-egwu, ekwe, udu na ọyọ. Abia zie kwa tinye ya ọja. Ngwa ọbụla nwere oku ọ na-aza. So ekwe, anụnwa éjị akụ ya bụ égwu bụ akwa na-ebuuta ihe egwu ọtọọ ụtọ. Ọ na abụ a na-akụ ya, ọlọọ alọ, ọ na-atọ ụtọ.

Vidio[dezie | dezie ebe o si]

EGWU ATỊLỌGWỤ







Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:ATILOGU_DANCE.ogg
  2. A.I.D project (2023-2-4). Audiovisual Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-11.