Egwu MMỤTAKA

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Egwụ Mmụkata

Mmụtaka[1] bụ egwu ndi obodo Ubaha nke di n' Umunze Anambra Steeti. Egwu a si n' egwu a na-akpo Mkpọkịtị wee pụta. Egwu a bụ mmụtaka bidoro n' ụlọ akwụkwọ. Mgbe ahụ, a na-agbakari ya site na elekere iri ụtụtụ ruo elekere iri na ofu. A na eme nke a ma ụra tụba ụmụ akwukwo, ewe si ha pụta iro. Ha putakwanụ iro ahụ, ha emegharicha áhụ wee banye kwaa wee guwazie kwa akwụkwọ, ụra apụ. Oge ana-eme ihe a ka Mkpọkịti a nke bukwa aha onye egwu a sitere n’aka ji nwe wee hụkọtachaa ụmụaka ndị mere ihe a. Ka umuaka a na eme ya mgbe o bula, ha wee buru ụmụaka siri ike wee gosikwa na o bu onye siri ike ga-agbawu egwu a. Nke a mere akpo egwu a Mkpokịti.


Site mgbe ahu, a na-agbazi egwu a. Amatara ihe gbanyere egwu a na afo 1970s. E jiri egwu Mkpokiti merie otutu ogene olaedo ugboro na ato na Naịjirịa. O bu ya ka agbara na afo 1970 mgbe emere National competition nke mbu nke ndi Arts and Culture ebe egwu a nwetere ogene olaedo nke izu. Egwu were nwetakwa ogene olaedo ozo na afo 1971 na obodo Ibadan. Otu a ka o dikwa na afo 1972 na Kaduna mgbe o bukwere ogene olaedo ahu ozo.

Otito a nukwa na obodo Umunze ruo taa. A gbagidere egwu a ruzie oge Mkpokịti onye o bidoro na aka nwụrụ. Egwu Mkpokiti wee kewazie  na otu di iche iche nke Mmutaka bu otu n’ime ha.  

Ihe eji kpọọ egwu a Mmụtaka bu oke a no na mkpokiti ahu udi ihe a na agba, ndi mmadu wee che na enwere ọgwụ di ya. Mana a na enwe nkowa na ihe a na-agba bu ihe amụtara amụta nke kariri ọgwụ.

E nwere otutu akwa eji aku mmutaka. Ha bu igba nke a ji agbazi otu esi agba egwu a n'usoro n'usoro, ịchaka na ogwe. Ogwe bu nke na enyere igba aka na ibuputa uda egwu. Igba a bukwa ma nke ukwu ma nke obere. Enwe kwara ogene, ekwe  ero, na opi.[2][3]


Mkpọputa[dezie | dezie ebe o si]




Vidio[dezie | dezie ebe o si]







Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:Mmutaka_dance.ogg
  2. A. I. D. Project (2023-02-04). English: Mmutaka is an igbo cultural dance indigenous to the Umunze community in Orumba South LGA in Anambra State, Nigeria. It originated from the Mkpọkịti dance. This audiovisual was recorded in Umunze community in Orumba South LGA in Anambra State on 23 August 2022. The video features a dance performance from the Mmụtaka cultural troupe and a story from Chief Bernard Iro Mbah, Chief Azuka and Okechukwu Okem in Umunze Anambra State. The video was directed and produced for the Audiovisuals of Igbo Dances Project (AID) by Tunde Oladimeji, a notable documentary film maker in Nigeria.. Retrieved on 2023-03-12.
  3. A.I.D project (2023-2-4). Audiovisual Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-11.