Egwu Mmọnwụ Ọkanga

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Egwu MMỌNWỤ Ọkanga
type of dance
obere ụdị nkefolk dance Dezie
ụmụ amaala kaNdị Igbo Dezie
mba osiNaijiria Dezie
WikiProject na-elekọta yaWikiProject Intangible Cultural Heritage Dezie

Egwu Mmọnwụ Ọkanga[1] bụ nke ndi Okwoamankwọ Ngwo. Ọkanga a bụ egwu ndi ukwe na-agba, agbashi  ike. Sọ ụmụ nwoke bụ ihe na-agba egwú a. Eji ya eje akwamozu, ịgba nkwụ, ma ọ bụru na enwee ihe a na-eme na gọọmentị ugbua, egwu a na-eje ebe ahụ. Na obodo nwe egwu a, a na eji ya akwa ndị nọ na otu mmọnwu a ma ha nwụọ. Ndị na-agba egwú a bụ ụmụaka, ndị okenye na-agbakwa, mana mmụọnwụ pụta, mmụọnwụ a nwe egwu a pụta, ụmụaka ama agbazị egwu ahụ, ụmụnwaayi agaghị agbakwa egwu ahụ ozọkwa. O nwere usoro eji ágbá egwu Ọkanga. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọgaranya bia akwamozu, ị ga ebunye ndị nka ahụ nwe Ọkanga ahụ mmanya. Ha ṅuchaa mmanya, ebuzie egwu a gawazie ebe aga emezi ya bu akwamozu. Ọbụghị onye yi ezigbo ákwà dị ọcha na agba egwu a maka aga ete unyi n'ákwà ahụ. Ọkanga bu Égwu eji ike na obi añuri agba [1].

Mkpọpụta[dezie | dezie ebe o si]




Ngwa Égwu Ọkanga[dezie | dezie ebe o si]

Ana enyi uwe na-acha agwa dị iche iche eberisiri eberi were agba egwú a. A na-eyi aka n'olu na ma jiri ọdụ ehi n'aka abụọ tinyere iberibe asịsa ana eyi n'ukwu na ikpere. Ndị n'aka ya egwu a n'agwa isi agụ na okpu ndị nze iji gosipụtakwa omenala [2]

Ndị a bụ ụfọdụ ngwa eji akụ egwu ọkanga.

Vidio[dezie | dezie ebe o si]

EGWU ỌKANGA







Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:OKANGA_-_MASQURADE_DANCE.ogg
  2. AID project (2023-02-04). Audiovisual of Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-11.