Elegua

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Ihe osise nke Ellegua

Elegua (Yoruba) bụ Orisha, chi nke okporo ụzọ n'okpukpe Santería, Winti, Umbanda, Quimbanda. Holy Infant of Atocha, na Candomblé.

N'Africa[dezie | dezie ebe o si]

A maara Elegua dịka Èpande-Nego n'okpukpe Yoruba ma nwee njikọ chiri anya na Eshu. Elégbára pụtara "Onyenwe nke ike" na-asụsụ Yoruba

Santería[dezie | dezie ebe o si]

A maara Eleguá (Legba) na Dominican Republic, Haiti, Colombia, Cuba na Puerto Rico dịka orisha na "onye nwe" caminos, maọbụ okporo ụzọ na ụzọ. Emume na nhunye niile dị na Santería ga-ebu ụzọ nweta nkwado nke Eleguá tupu ọ gaa n'ihu. Ọ bụ onye ozi Olofi. N'ime "Regla de Ocha" [Cuba], ọ dịtụ iche na Echu, onye a na-ahụ dịka nwanne ya nwoke, site n'inwe àgwà ndị na'adịghị ize ndụ na ndị dị obere. Eleguá na-agagharị n'ụzọ dị jụụ; n'ụzọ megidere nke ahụ, Echu "na-agbapụ". Ihe ngosi nke Eleguá gụnyere Akefun, Aleshujade, Arabobo, Awanjonu, Lalafán, Obasín, Oparicocha, na Osokere.

E nwere patakí (akụkọ) na Santería nke Olodumare nyere Eleguá mkpịsị ugodi nke oge gara aga, ugbu a, na ọdịnihu; n'ihi nke a na-egosikarị Elequá na ọ na-ejide mkpụsị igodo. E nwere ike itinye onyinyo Eleguá n'ụlọ n'azụ ọnụ ụzọ mbata.

Na Brazil[dezie | dezie ebe o si]

N'okpukpe Afro-Brazilian Elegbara bụ otu n'ime utu aha nke Exu.

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]