Elizabeth Ativie

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Elizabeth Ativie
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereElizabeth Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nurse Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Congress Dezie

Elizabeth Ativie bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nke na-eje ozi ugbu a dị ka osote ọnụ na-ekwuru ụlọ ome iwu nke Edo Steeti kemgbe ụbọchị nke 25 n'ọnwa Julaị afọ 2016. Ọ rụrụ ọrụ dị ka ọnụ na-ekwuru ụlọ ome iwu site n'ụbọchị nke 9 n'ọnwa Mee afọ 2016, ruo ụbọchị nke 24 n'ọnwa Julaị afọ 2016.

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Elizabeth Ativie bụ nwaafọ Edo Steeti mana o toro n'ọtụtụ akụkụ ala Naịjirịa n'ihi ọnọdụ ọrụ nna ya bụ onye uwe ojii. O nwere nzere bachelọ na Health Education na nzere nast na Sociology and Anthropology . [1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Elizabeth rụrụ ọrụ dị ka ọkachamara nọọsụ na Edo State Civil Service ruo n'afọ 2006 mgbe ọ lara ezumike nká dị ka Daịrektọ. [1] Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya malitere n'afọ 1999. N'afọ 1999 ma n'afọ 2003, ọ zọrọ oche maka ụlọ ome iwu Edo Steeti mana ọ rịturu n'ọkwa ugboro abụọ ahụ maka otu n'ime ndị ga-azọ ọkwa ọchịchị n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya. [2]

Elizabeth zọrọ ma merie oche na State House na ntuli aka izugbe nke afọ 2007. Ụlọ ikpe mechara kagbuo ntuli aka ahụ. Kosiladị, mkpebi ya kwụrụ ụgwọ n'afọ 2011, mgbe ọ meriri oche ịnọchite anya mpaghara Uhunmwode na State House. [2]

Mgbe e nwepuchara Victor Edodor n'ụbọchị nke 3 n'ọnwa Mee afọ 2016, [3] Elizabeth ghọọrọ nwanyị izizi bụ ọnụ na-ekwuru ụlọ ome iwu Edo Steeti na-esote n'iyi e duru ya n'ụbọchị nke 9 n'ọnwa Mee, afọ 2016. [4] [5] N'ụbọchị nke 25 n'ọnwa Julaị, ọ gbadara bụrụ osote ọnụ na-ekwuru ụlọ ome iwu mgbe Onye ndu ọtụtụ ndị,bụ Folly Ogedengbe kpalitere mkpesa, onye kpọpụtara "matters of urgent public importance, for a change in the leadership of the House". Onye nọchiri ya bụ Justin Okonoboh. [6]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Photos: Hon. Elizabeth Ativie, 1st Female Speaker Of Edo State House Of Assembly Sworn In..See Profile. NaijaGist (9 May 2016). Retrieved on 27 May 2016.
  2. 2.0 2.1 "Women are scared of the muddy water of politics – Hon.Elizabeth Ativie", 8 April 2012. Retrieved on 27 May 2016.
  3. "Edo Assembly Speaker,Deputy Impeached", Channels Television, 3 May 2016. Retrieved on 27 May 2016.
  4. "Edo House Of Assembly Speaker Sworn-In", Channels Television, 9 May 2016. Retrieved on 27 May 2016.
  5. "Edo State Assembly swears in Mrs. Elizabeth Ativie, As new Speaker", DailyMedia Nigeria, 9 May 2016. Retrieved on 27 May 2016.
  6. "Edo Speaker, Elizabeth Ativie steps down for deputy", Vanguard, 25 July 2016. Retrieved on 31 August 2016.