Elizabeth Isichei

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Elizabeth Isichei
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNew Zealand Dezie
Aha enyereElizabeth, Mary Dezie
aha ezinụlọ yaIsichei, Allo Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Maachị 1939 Dezie
Ọrụ ọ na-arụhistorian, university teacher, odee uri Dezie
onye were ọrụUniversity of Otago, University of Jos Dezie
Ọkwá o jifull professor, professor emeritus Dezie
ebe agụmakwụkwọVictoria University of Wellington, University of Canterbury, Tauranga Girls' College, Nuffield College Dezie
Ebe obibiNaijiria Dezie
Ihe nriteFellow of the Royal Society Te Apārangi Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Elizabeth Allo Isichei (a mụrụ na otu puku afọ narị iteghete ịrị atọ na iteghete (1939) na Tauranga, New Zealand ) bu onye Naijiria odee, onye ọkọ akụkọ ihe mere eme na agụmakwụkwọ . [1] [2] Nne na nna ya bụ Albert (onye ọkà mmụta sayensị ugbo) na Lorna Allo. [2] Na abalị ịrị abụọ na atọ nke ọnwa Julaị na afọ otu puku narị iteghete ịrị isi na anọ (1964) ọ lụrụ Uche Peter Isichei (onye na-ahụ maka ọrịa kemịkalụ) ma ha mụtara ụmụ ise. [2] Na na afọ otu puku narị iteghete ịrị ise na iteghete (1959) o nwetara nzere nke BA ya na Mahadum Canterbury dị na New Zealand, BA [2] Na afọ otu puku narị iteghete na iri ịsịi na otu (1961) ọ gụchara MA na Mahadum Victoria nke Wellington, New Zealand, e ruo na afọ otu puku narị iteghete na iri isii na asaa (1967) ọ mesia PhD na Mahadum Oxford. [2] Ọ bụbu nnukwu ọka mmụta Prọfesọ nke ọmụmụ okpukperechi na Mahadum Otago . [3] Ọ bụrịị nnukwu oka mmụta prọfesọ na ngalaba akụkọ ihe mere eme, Mahadum Jos na Jos, Nigeria kemgbe otu puku afọ narị iteghete na iri asaa na isii (1976). [2] Ọ bụ onye nchịkọta akụkọ izugbe nke Jos Oral History and Literature Texts . [2]

Ọrụ ya na akwụkwọ ya gbadoro ụkwụ na Ụka Kraịst na Afrịka na akụkọ ihe mere eme nke Naijiria karịsịa ndị Igbo . [4]

Ọrụ ahọpụtara[dezie | dezie ebe o si]

  • 1964: Echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Ahụmahụ Ọha na Ọha: Ụfọdụ nkọwa Ndị Kraịst nke Alaeze Ukwu Rom, Mahadum Canterbury Publications
  • 1970: Victorian Quakers, Oxford University Press
  • 1973: Ndị Ibo na ndị Europe: Mmalite nke Mmekọrịta, ruo 1906, St. Martin's
  • 1976: Akụkọ Gbasara Ndị Igbo, St. Martin
  • 1977: Akụkọ gbasara West Africa kemgbe 1800, Africana
  • 1977: Ụwa Igbo: Akwụkwọ akụkọ gbasara akụkọ nke ọnụ na nkọwa akụkọ ihe mere eme, Ụlọ Ọrụ Na-amụ maka Ihe Ndị Mmadụ
  • 1981: Kpam Kpam maka Chukwu: Ndụ Michael Iwene Tansi, Macmillan Nigeria
  • 1982: Ọmụmụ na akụkọ gbasara Plateau State, Nigeria, Macmillan
  • 1983: Akụkọ gbasara Naijiria,Longman
  • 1995: Akụkọ banyere Ụka Kraịst na Africa: Site n'oge ochie ruo ugbu a, Africa World Press
  • 1997: Akụkọ gbasara obodo ndi Afrịka ruo 1870, Cambridge University Press
  • 2002: Olu ndị ogbenye na Africa, Mahadum Rochester Press (Rochester, NY)
  • 2004: Omenala Okpukpe nke Africa: Akụkọ, Raeger (Westport, CT)
  • 2005: Stoptide, Steele Roberts (New Zealand)

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Erik Lönnroth (1994). Conceptions of National History: Proceedings of Nobel Symposium 78. Walter de Gruyter, 116–. ISBN 978-3-11-013504-6. 
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 2.6 Contemporary Authors Online. Biography in Context. Gale (2014). Retrieved on 9 March 2016.
  3. Elizabeth Isichei (13 April 1997). A History of African Societies to 1870. Cambridge University Press, 582–. ISBN 978-0-521-45599-2. 
  4. Kalu Ogbaa (30 January 1999). Understanding Things Fall Apart: A Student Casebook to Issues, Sources, and Historical Documents. ABC-CLIO, 66–. ISBN 978-1-57356-667-4.