Ella Kamanya

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ella Ndatega Kamanya (9 Nọvemba 1961 - 31 Julaị 2005) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya na nwanyị ọchụnta ego nke obodo Namibia.[1] Ọ sonyeere South West Africa People's Organization (SWAPO) na afo 1978 ma lanarị Agha Cassinga n'oge esemokwu ya na ndị agha South Afrika.

A họpụtara Kamaya ka ọ bụrụ onye omeiwu mba Namibia n'afọ 2003, na-anọchi anya Hage Geingob. N'ọnwa Machị afọ 2004, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye omeiwu Pan-Afrikan.

Mmalite ndu[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Kamanya na 9 Nọvemba n’afo 1961 na Onangalo, Uukwaluudhi Kingdom, Ovamboland. Nna ya bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye ọchụnta ego a ma ama. Ọ tolitere n'ezinaụlọ Ndị Kraịst na-anụ ọkụ n'obi.[2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1978, ọ sonyeere SWAPO na mba ọzọ, n'oge na-adịghịkwa anya mgbe ọ rutere Cassinga, Angola, ndị agha South African Defence Force wakporo ogige ebe ya na ndị Namibia ọzọ a chụgara mba ọzọ. E jidere ya n'oge Agha Cassinga nke Mee afo 1978, laghachi obodo South-West Afrika, ma mesịa tụọ ya mkpọrọ na Oshakati.[2]

Nwanyị ọchụnta ego site na ọrụ, Kamanya na-arụ ọrụ ihe nkiri na Ongwediva ya na Ondangwa tupu ọ banye na National Assembly. Ọ rịọrọ ka e lie ya n'ebe ugwu Obodo Namibia.[1]

Arụmụka[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Machị nke afọ 2004, Kamanya chere nkatọ ihu maka ebubo nrụrụ aka na nkwekọrịta metụtara azụmahịa Black Economic Empowerment na obodo San nke obodo Namibia. Ọ gọnahụrụ ebubo ahụ wee nwụọ na Onwa Julai afo 2005.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Ex-MP Kamanya dies in The Namibian, 1 August 2005
  2. 2.0 2.1 Shiremo. "Ella Ndatega Kamanya:...A humble, but determined woman.", New Era, 8 April 2011. Retrieved on 8 January 2012. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Shiremo" defined multiple times with different content