Elsie Nwanwuri Thompson

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Elsie Nwanwuri Thompson
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereElsie Dezie
Ọrụ ọ na-arụoka mmuta Dezie
ebe agụmakwụkwọQueen Mary University of London Dezie

Elsie Nwanwuri Thompson bụ onye ọka ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Rivers State, Nigeria. A mụrụ ya ma zulite ya na port Harcourt ọ rụrụ ọrụ dị ka osote onye ịsị ala na onye isi ala maka International Federation of Women Lawyers Nigeria. Ọ bụkwa onye enyemaka na nzukọ ọmụmụ ihe na nzukọ. [nkọwa dị mkpa] Na 27 Julaị 2010, ọ ghọrọ onye Naijiria mbụ a họpụtara na Ụlọikpe Africa na-ahụ maka ikike mmadụ na ndị mmadụ maka afọ isii. Ọ bụ osota onye isi oche nke ụlọ ikpe site na 2014 ruo 2016.[1]

Agụmakwụkwọ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Thompson nwetara nzere bachelọ nke iwu (LLB) na nsọpụrụ site na Queen Mary College University of London. A nabatara ya n'ụlọikpe ndị England n'afọ 1984 ma nabata ya na uloikpe Naịjirịa n'afọ 1985. Ruo ihe dị ka afọ 20, ọ rụrụ ọrụ n'ụlọ ọrụ iwu onwé onye ma rụọ ọrụ n'okwu gbasara ikike mmadụ karịsịa na ikike ụmụ nwanyị. N'afọ 1998, a kpọrọ ya otú n'ime "Ndị ntorobịa iri pụtara ìhè nke afọ" nke junio Chamber International.[2]

Thompson anọwo n'ọkwa dị iche iche na International Federation of Women lawyers gụnyere Onye isi ala (Onye isi ala) na ónyé isi ala mpaghara maka Africa.[1] A hoputara ya dị ka onye ọka ikpe nke ulo ikpe Africa na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na ndị mmadụ na 27 Julaị 2010 wee bụrụ osote onye isi ala na Septemba 2014.[3][4] Ọ bụ ónyé otu Honourable Society of Gray's Inn ma bụrụkwa Fellow nke Chartered Institute of Arbitrators.[1]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ Sir Igonibo Emmanuel Thompson ma ha nwéré ụmụ.[1]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Justice Elsie Nwanwuri Thompson. en.african-court.org. Archived from the original on 17 November 2020. Retrieved on 16 September 2016.
  2. Ten Outstanding Young Persons of the year 1998. Jci.ng. Retrieved on 16 September 2016.
  3. Levitt (2001). Black Women and International Law. Cambridge University Press. ISBN 1107021308. 
  4. Judicial and Human Rights Institutions. au.int. Archived from the original on 18 May 2019. Retrieved on 16 September 2016.