Ememe Kanival Calabar

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ememe Kanival Calabar
festival, tourist attraction
Oge/afọ mmalite2004 Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
ebeCalabar Dezie
nhazi ọnọdụ4°58′7″N 8°20′27″E Dezie
Map

Ememe Kanival Calabar na Naijiria, nke a makwaara dị ka " Africa's Biggest Street Party " ma ọ bụ " Nganga Nigeria ", [1] bụ mmemme a na-eme kwa afọ na Cross River State, na mpaghara ndida nke Nigeria. [2] A na-eme mmemme ahụ kwa ọnwa Disemba ma bụrụkwa onye gọvanọ oge ahụ bụ Maazị Donald Duke kwuputara na o gaabụ mmemme eji emerube emume ekeresimesi ma kwuo na ebumnuche ya maka ime mmemme ahụ bụ ime ka Cross-River bụrụ ebe njem nlegharị anya na ile ọbịa na Naijiria na Africa . . Kemgbe ọtụtụ afọ, àgwà nke ememe a na-etowanye eto ma na-aghọkwa ememe mba ụwa nakwa emume Kanival kachasị na ala Naijiria. Ọ na-abụ mmemme a na-eme otu ọnwa nke na-amalitekarị n'abalị mbụ nke ọnwa Disemba ruo mgbe Benedict Ayade wedara ya izu abụọ mgbe a họpụtara ya. N'oge mmemme mmemme nke afọ 2017 Gọvanọ Ayade kwuru n'okwu ya na mmemme Kanival a bụ igosi Africa dị ka kọntinent kacha baa ọgaranya na ebe a gọziri agọzi ebe ndị na-eto eto kwesịrị ịnya isi na ha bụ. Emume Kanival a na-abụkarị ihe a na-atụ anya ka asọmpi dị iche iche na-ewere ọnọdụ nke a na-erite kwa ego buru ibu dịka ihe nrite, kanival a bụ nnọọ nke n'ama mma. [3] [4]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Ememe kanival Calabar malitere n'afọ 2004 site n'aka Gọvanọ Donald Duke nke Cross River, dịka ụzọ isi kwalite njem nlegharị anya na ịkwalite akụ na ụba obodo [5] . [4] Dị ka Osima-Dokubo si kwuo, "Kanival bụ iji tinyekwuo akụkụ nke ihe nketa na omenala obodo na n'otu oge ahụ na-ewusi ikike nke ndị obodo ike isonye n'ụzọ bara uru." [6]

Ihe Omume[dezie | dezie ebe o si]

A na-ahazi mmemme ahụ kwa afọ nke ọ bụ kọmitii na-ahụ maka njem nlegharị anya na ihe omume omenala na-ahụ maka ya, a na-ebute atụmatụ ọhụrụ kwa afọ na isiokwu dị iche iche a na-ahọrọ kwa afọ iji wee mee ka kanival a na aga n'ihu. Na Disemba 2009, kọmitii kanival haziri "iko emume Kanival ahụ nke afọ 2009", asọmpi bọọlụ n'etiti ndị otu egwuregwu asọmpi ise - Seagull, Passion 4, Masta Blasta, Bayside na Freedom. Enwere ike ịmata ndị otu a site n'agba ha. Ndị otu Seagull bu ndi agba na acha uhie uhie bu ndi a maara dika ndị kachasị achikọta onwe ha, otu Passion 4 bu ndi nke ha na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, ha bukwa ndị kachasị eme nke ọma, Masta Blasta bu ndi nke ha na-achagha achagha, ha bukwa ndị kachasị n'ọnụ ọgụgụ, otu Bayside bụ nke na-acha anụnụ anụnụ, na otu Freedom bụ ndi nke ha na-acha odo. [7] Ememe a na-agụnyekwa egwu sitere na ndị mpaghara a na nke mba ụwa, emume kanival Calabar a na-eme kwa afọ, Boat regatta, ihe ngosi Ejiji (e wepụtara na 2016), Beauty pageant (Miss Africa ewepụtara na 2016 [8] ) Christmas Village, egwu ọdịnala na emume Ekpe a na-eme kwa afọ bu mmemme na-ebute puku kwuru puku ndị njem nleta. [4]

Ihe omume ndị ọzọ mebere kanival nke a gụnyere asọmpi ide edemede nke metụtara ma ụlọ akwụkwọ sekọndrị na ụmụ akwụkwọ mahadum. Emebere asọmpi ndị a iji kwalite omenala ịgụ akwụkwọ n'etiti ndị ntorobịa steeti nakwa ịkụnye omenala oriri na ọṅụṅụ. [9]

Ndị na-esonye[dezie | dezie ebe o si]

Ihe omume a na-anabata ndị egwu obodo na mba ofesi, ndị na-eme ihe nkiri Nollywood, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị nwoke na nwanyị ndị ọzọ ama ama si Naijiria na mba ofesi. Ụfọdụ n'ime ndị na-eme ihe nkiri bụ ndị gara oriri na ọṅụṅụ gụnyere Lucky Dube, Akon, Fat Joe, Young Jeezy, Nelly, Kirk Franklin. Kanival Calabar nke afọ 2013 l

lekwasịrị anya na ndị egwu na Naijiria. [4]

Kanival Calabar nke afọ 2015, Isiokwu: "Mgbanwe ihu igwe"[dezie | dezie ebe o si]

Emere ememe kanival Calabar na 2015. [10] Mmemme a nabatara ihe karịrị mba iri na ise n'afọ 2015 dịka Gọvanọ steeti Cross RIver bụ Maazị Ben Ayade siri kwuo. [11] Gọvanọ ahụ kpọbatara ndị ụmụ agbọghọ mara mma ka ọ guzobe otu egwu a maara dị ka ndị egwu gọvanọ. [12]

Ememe na Kanival Calabar nke afọ 2017, Isiokwu: Mbugharị[dezie | dezie ebe o si]

Mbugharị [13] nwere ogologo akụkọ ihe mere eme n'Africa, dịka ọ bụkwa ebe obibi nke ọtụtụ omenala kemgbe ọtụtụ narị afọ. [14]

Ememe na Kanival Calabar nke afọ2018 Isiokwu: "Africanism"[dezie | dezie ebe o si]

Na ememe nke afọ 2018, nke mere ya emume nke iri na ise kemgbe mmalite ya na 2004, Gọvanọ steeti Cross River, Sen, Benedict Ayade webatara isiokwu ọhụrụ nke a kpọrọ " Africanism " iji kọọ akụkọ Africa site n'echiche Africa. Isi okwu a bu n'obi igosikwa na Afrịka enwerela onwe ya pụọ n'ịchịkwa ọchịchị nke akụ na ụba nke ndị ọcha. [15]

Akpọrọ isiokwu Ememe na Kanival Calabar nke afọ 2019 "Humanity"[dezie | dezie ebe o si]

E kere isiokwu kanival Calabar nke a kpọrọ "Humanity" iji maa mmadụ aka na mmadụ ọ bụla nwere ikike ịdị adị. E bukwa n'uche ka isiokwu ahụ gwa ụmụ mmadụ ka ha ghara ịbụ ihe na-ebute nwute nye ndụ onye ọzọ. Ewezuga ịgba egwu na igosiputa omenala ndi Afrika, emume kanival Calabar bu n'obi ilebanye anya na nsogbu nke uwa, nke mmeso obi ojoo so na ya. Ka Gọvanọ Benedict Ayade siri kwupụta isiokwu nke afọ a - Humanity o kwusiri ike na ọ dị mkpa ka mmadụ niile gbanarị agha n'ihi na nke a anaghị egosipụta ezi àgwà nke ndị na-ekwu na ha na-emere mmadụ ihe. [16]

Ememe na Kanival Calabar nke afọ 2020[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2020, n'ihi ọrịa mba uwa coronavirus na mmachi amachiri nnukwu nnọkọ na mba ahụ, amachibidoro ememe ahụ. [17] Ndị ụlọ omebe iwu steeti Cross River kpọkwara oku ka ha kwụsị mmemme ahụ n'afọ 2020 n'ihi oke mbibi na ịkwakọrọ ngwongwo na akụrụngwa nke ndị omekome zokpuru n'okpuru ngagharị iwe #EndSARS na-eme nakwa n'ihi n'ọrịa Covid 19 ka na-aga n'ihu n'ụwa na n'ime obodo. [18]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ememme na Naijiria

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 🏅 CALABAR CARNIVAL 2020-NIGERIA | Dates, Events & More (en-US). www.carnivaland.net. Retrieved on 2021-08-01.
  2. Inside Calabar Carnival, Africa's Biggest Street Party (en-US). Folio (2020-05-14). Retrieved on 2021-08-18.
  3. Many shades of Calabar Carnival 2017 (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2018-01-07). Retrieved on 2021-08-18.
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 Ifop (2016-12-25). History of Carnival Calabar, It Bands & More (en-GB). The Paradise. Archived from the original on 13 July 2021. Retrieved on 2019-10-18.
  5. 🏅 CALABAR CARNIVAL 2020-NIGERIA | Dates, Events & More (en-US). www.carnivaland.net. Retrieved on 2021-08-01.
  6. 🏅 CALABAR CARNIVAL 2020-NIGERIA | Dates, Events & More (en-US). www.carnivaland.net. Retrieved on 2021-08-01.
  7. Inside Calabar Carnival, Africa's Biggest Street Party (en-US). Folio (2020-05-14). Retrieved on 2021-08-18.
  8. Miss Africa Archives (en-GB). The Paradise. Archived from the original on 9 July 2021. Retrieved on 2019-10-18.
  9. Cross River students write essay (en-US). The Nation Newspaper (2013-11-20). Retrieved on 2022-02-18.
  10. CALABAR CARNIVAL 2015 (en-US). Nigerian Tourist Guide. Archived from the original on 10 March 2016. Retrieved on 2016-03-13.
  11. 15 countries to attend Calabar Carnival 2015 | Premium Times Nigeria (en-GB) (2015-12-13). Retrieved on 2021-08-14.
  12. Calabar Carnival 2015: Gov Ayade adopts beauty queens (en-US). Vanguard News (2015-11-27). Retrieved on 2021-08-14.
  13. Ifop. CRSG Reveals 2017 Carnival Calabar Theme (en-GB). The Paradise. Retrieved on 2019-10-18.
  14. http://carnivalcalabar.net/. Archived from the original on 2022-01-23. Retrieved on 2022-02-23.
  15. Ifop. Carnival Calabar 2018 Theme Dubbed 'Africanism' (en-GB). The Paradise. Archived from the original on 11 July 2021. Retrieved on 2019-10-18.
  16. Ifop (2019-08-16). Carnival Calabar 2019 Theme Is "Humanity" - Ayade (en-GB). The Paradise. Archived from the original on 11 July 2021. Retrieved on 2019-10-18.
  17. CALABAR so different this December! (en-US). Vanguard News (2020-12-18). Retrieved on 2021-08-14.
  18. Cross River Assembly calls for suspension of Calabar Christmas Carnival (en-US). Businessday NG (2020-11-19). Retrieved on 2021-08-14.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

NN