Gaa na ọdịnaya

Enuani dialect

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Enuani bu asụsụ kulu iche. Sisọ ndi Enuani nwe yabu asụsụ. Wa na sụa na Oshimili na Aniọcha nime Delta State, Naijiria. Asụsụ Enuani di iche. Wa na sụa na obodo dika Asaba, Igbuzo, Ọkpanam, Issele-Uku, Ọgwashi-Uku, Ubulu-Uku, Ubulu-Unor, Ejeme-Aniogo, Egbudu-Akah, Akukwu-Igbo, Idumuje-Uno, Idumuje-Ugboko, Illah, Onicha-Ugbo, Onicha-Olona, Ukwunzu na obodo di nso.

Enuani bu asụsụ kulu n’onwe-e. Onwe ụda onu nke-e, usolo ụda onu, usolo ụda okwu na ụsọasụsu nke-e

Ndi Enuani nwe njilimali bewe, nke kulu iche, nke di iche. Nke sisọ wa nwe. Nwe omenani di iche, ụnọ ọlụ ọchichi odinani na omume omenani.

Ebe wa na su Enuani

[dezie | dezie ebe o si]

Enuani bu asụsụ obodo wa na asụkali na akuku ugwu Delta state, Naijiria. Wa na asụa sisọ nime ogbe Aniọcha na Oshimili. Ọ asụsụ ani nke ndi Enuani, bu ndi wa ma maka njilimali omenani, akukwọ ife me ge ni na asụsụ nke wé.

Ogbe wa na asụ Enuani

Wa na asụ asụsụ Enuani nime ogbe dịka

Asaba, Ibusa (Igbuzo), Okpanam, Issele-Uku, Issele-Azagba, Issele-Mkpitime, Ogwuashi-Uku, Ubulu-Uku, Ubulu-Okiti, Ubulu-Unor, Ejeme-Aniogo, Idumuje-Ugboko, Idumuje-Unor, Onicha-Ugbo, Onicha-Olona, Onicha-Uku, Illah, Ukwunzu, Ukala Okpunor, Ukala Okwute, Akukwu-Igbo, Egbudu-Akah, Ashama, Oko, Ugbodu, na ọfọdụ one nọchibe ndi a.

Ogbe ndi a nwe nwọta asụsụ, na wa bu ofu nime uda onu. Ya me ka Enuanu bulu asụsụ jikota ọnụ nime akuku obodo e.

Njilimali Asụsụ

Ndi na asụ Enuani nweli Enuani di ka asụsụ di iche, nwe akukwọ ife me ge ni nwe omimi, usolo uda a kulu iche. Usolo ụda okwu e, ụsọasụsụ nke-e, na usolo uda onu jikọta ọnụ na asụsụ.

Omenani Nke Di mkpa

Enuani ọbuhọ sisọ asụsụ. Ọ akụkụ bụ́ isi nke njilimali Enuani. Ndị na asụ Enuani nogide nenwe mmetụta sili ike nke obodo na inwe asụsụ. Ọ bu asụsụ wa ji a zikọta ozi okwu omenani, ịkọ akikọ, emume omenani, na izili ife ọmụma n'etiti ọgbọ.