Enweghị mmiri n'Africa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Isi iyi mmiri nke obodo Mwamanogu, Tanzania. Nke dị na Meatu District, Shinyanga Region, mmiri na-esikarị n'oghere ndị e gwuru n'ájá nke ala osimiri kpọrọ nkụ, ọ na-emetọkwa ya,mee ka ogharụ ịdị ọcha mgbe niile.

A na- enejere anya na ụkọ mmiri n'Africa ga-eru n'ókè dị elu n'afọ 2025 mgbe a na-eme atụmatụ na ihe dị ka ụzọ abụọ n'ụzọ atọ nke ndị bi n'ụwa nwere ike ịta ahụhụ site na ụkọ mmiri dị ọcha. Isi ihe na-akpata ụkọ mmiri n'Africa bụ ụkọ ihe ndị a n'ahụ anya na ụkọ akụ na ụba, mmụba ngwa ngwa nke ọnụ ọgụgụ mmadụ, na mgbanwe ihu igwe. Enweghị mmiri bụ enweghị mmiri dị ọcha iji gboo mkpa mmiri dị mma.[1] Ọ bụ ezie na Sub-Saharan Africa nwere ọtụtụ mmiri ozuzo, mana ọ dịghị ezo oge niile, nkesa ya adịghị mma, nke a na ebute idei mmiri na ụkọ mmiri ozuzo ugboro ugboro.[2] Tụkwasị na nke a, mmepe akụ na ụba zuru oke na nsogbu ịda ogbenye, tinyere mmụba ngwa ngwa nke ọnụ ọgụgụ mmadụ na isi ime obodo na-akwaga obodo ndi mepere emepe n'ime emeela ka Sub-Saharan Africa bụrụ mpaghara kachasị daa ogbenye na nke na-emepebeghị emepe n'ụwa.[2]

Ozi ana enweta site na otu n'ahụ maka Nri na Ọlụ Ugbo 2012 nke United Nations na-egosi na ụkọ mmiri na-arịwanye elu bụ otu n'ime ihe ịma aka n'ihe gbasara mmepe na-adịgide adịgide.[3] Nke a bụ n'ihi na ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ọdọ mmiri ahụ eruola ọnọdụ nke ụkọ mmiri site na ngụkọta nke ọrụ ugbo na ngalaba ndị ọzọ. Mmetụta nke ụkọ mmiri n'Africa sitere na ahụike (ụmụ nwanyị na ụmụaka na-emetụta karịsịa) na agụmakwụkwọ, mmepụta ọrụ ugbo, mmepe na-adịgide adịgide yana ikike maka esemokwu mmiri.

Iji dozie nsogbu nke ụkọ mmiri n'Africa n'ụzọ zuru oke, United Nations Economic Commission for Africa na-ekwusi ike na ọ dị mkpa itinye ego na mmepe nke ihe ndị nwere ike ime ka mmiri naa uba n'Afrịka. Nke a ga-eme ka nchekwa nri na nchekwa mmiri dịkwa mma karịa ma chebe uru akụ na ụba site n'ịchịkwa ụkọ mmiri ozuzo, idei mmiri, na ọzara.[4]

  1. Water Scarcity | Threats | WWF (en). World Wildlife Fund. Retrieved on 2020-11-29.
  2. 2.0 2.1 International Decade for Action: Water for Life 2005-2015. Retrieved on 1 April 2013.
  3. FAO (2012). Coping with water scarcity - An action framework for agriculture and food security, FAO Rome.
  4. Management Options to Enhance Survival and Growth. Archived from the original on 7 May 2020. Retrieved on 18 March 2012.