Erik Laubscher

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Erik Laubscher
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Aha enyereErik Dezie
aha ezinụlọ yaLaubscher Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1927 Dezie
Ebe ọmụmụTulbagh Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya22 Mee 2013 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie
omenkà faịlụ naFrick Art Reference Library Dezie

Erik Laubscher (afọ 1927, Tulbagh, South Africa rụọ úbọchị irí abụọ na abụọ n'ọnwa Maachị n'afọ 2013) bụ ónyé na-ese ihe nà South Africa.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Erik Frederik Bester Howard Laubscher na Tulbagh, ọ tolitere na Port Elizabeth. Mgbè o gosipụtara mmasị na nka, ọ malitere ọmụmụ ya na Continental School of Art n'afọ 1946.[1] Laubscher zụrụ n'okpuru Maurice van Essche site n'afọ 1946 na afọ 1947 tupu ọ gaa n'ihu na London na Paris n'okpuru John Minton, Claude Venard na Fernand Léger.[2] E nyere ya Carnegie Study Grant na US n'afọ 1966.[3] Na South Africa, e nyere ya Cape Arts Medal n'afọ 1972, S.A. Akademie vir Wetenskap en Kuns - Besondere Erepenning vir Skilderkuns n'afọ 1990, na The Cape Tercentenary Foundation Award màkà onyinye pụtara ìhè na nka ányá n'afọ 1994. O guzobere Ruth Prowse School of Art na 1970 wee laa ezumike nká dị ka onye isi ya na ngwụcha afọ 1995. Ọ lụrụ onye na-ese ihe Claude Bouscharain onye ọ zutere na Académie Montmartre na 1950.[1] N'afọ 2012 ọ natara ihe nrite Molteno màkà ihe ọ rụzuru na Fine Arts.[4]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Erik Laubscher. Strauss&co. Retrieved on 20 June 2020.
  2. Laubscher, Erik (Frederik Bester Howard). Absolut Art Gallery. Retrieved on 20 June 2020.
  3. Erik Laubscher. SouthAfricanArtists.com. Retrieved on 20 June 2020.
  4. CAPE TERCENTENARY FOUNDATION ARCHIVES - AWARDS. Cape 300 Foundation. Retrieved on 20 June 2020.