Errol Morrison

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Errol York St Aubyn Morrison (amụrụ na 21 Septemba 1945) bụ onye ọkà mmụta sayensị Jamaika nke rụrụ ọrụ dị ukwuu na Ọrịa shuga ma bụrụkwa onye isi oche nke Mahadum Teknụzụ, Jamaika .[1]

Ọ banyere na Mahadum Kọleji Ọdida Anyanwụ Indies ebe ọ nwetara mmasị na Biochemistry. O mechara nweta akara ugo mmụta ọgwụ na Royal University of Malta, nzere masta na Mahadum Kọleji London, na nzere doctorate na prọfesọ abụọ na Mahadum nke Ọdida Anyanwu Indies ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche na Dean nke ụlọ akwụkwọ nke ndi gụsịrị akwụkwọ na Nyocha. [2] Ọ hapụrụ Mahadum ahụ ka ọ bụrụ Onye isi oche nke Mahadum Teknụzụ, Jamaica.

Ọ rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ n'ọhịa ahụike na mmasị pụrụ iche na ọrịa shuga.[3] N'afọ 1982, ọ bụ onye ọsụ ụzọ guzobere Njikọ ọria ahụ ga nke Caribbean, nke nwere mba iri abụọ na isii ugbu a, ọ bụkwa onye isi oche ya site na 1985 ruo 1987 na osote onye isi oche site na 1989 ruo 1991. N'afọ 1991, ọ malitere Mahadum ọrụ mgbasa ozi ọria shuga (UDOP) site n'enyemaka nke Ntọala Wolfson. Ọ rụrụ ọrụ dị mkpa na mmekorita n'etiti Federation Ọria shuga mba ụwa na Otu nzukọ ahụike Pan Amerika (PAHO / WHO), na nzaghachi maka ọrịa shuga na-apụta, site na itinye usoro ntinye aka Nkwuputa St. Vincent na Amerịka, n'ụdị nkwupụta Amerịka na ọrịa shuga ma ọ bụ DOTA (1996).

N'afọ 1999, ụlọ ọrụ Institute nke Jamaika nyere ya Ihe nrite ọla edo nke Musgrave . [4]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Professor the Honorable Errol York St Aubyn Morrison. Archived from the original on 23 May 2013. Retrieved on 6 February 2015.
  2. University of Technology, Jamaica - About UTech. Archived from the original on 23 November 2009. Retrieved on 27 September 2009.
  3. Morrison (1995). "Phasic insulin dependent diabetes mellitus: manifestations and cellular mechanisms". Journal of Clinical Endocrinology & Metabolism 80 (7): 1996–2001. DOI:10.1210/jcem.80.7.7608247. PMID 7608247. 
  4. Musgrave Awardees. Institute of Jamaica. Archived from the original on 18 October 2014. Retrieved on 6 February 2015.