Ese Brume

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ese Brume MON (amuru 20 Jenuarị 1996) bu onye egwuregwu nke Naijiria amara nke oma na ogologo ịma elu . Ọ bụ onye mmeri nke Commonwealth ugbu a na onye mmeri ọkaibe nke Afrịka ugboro atọ n'ime ogologo ime elu, ma jide nke kacha mma nke 7.17mPage Àtụ:Fraction/styles.css has no content. 6 + 1⁄4in) [1] [2] O ji ugbu a ndekọ egwuregwu Commonwealth, ndekọ nke obere na Afrịka na ndekọ na mmemme ahụ na Afrịka. [3] Ọ bụ onye meriri ugboro abụọ n'asọmpi egwuregwu ụwa, onye meriri ọla nchara n'Olimpik ma burukwa onye mmeri ugboro ise n'egwuregwu nke obere ndị Afrika.

Ọ bụkwa naanị ya bụ onye nwe nturugo n'egwuregwu ogologo ima elu ugboro atọ n'usoro n'asompi Afrịka yana onye Afrịka mbụ nwetara nrite ogologo ima elu abụọ na asọmpi egwuregwu ụwa [4]

Brume bụ onye nwetara ihe nrite ọla edo n'egwuregwu ogologo ima elu n'asọmpị egwuregwu ụmụaka nke Afrịka nke afọ 2013, Egwuregwu Commonwealth 2014, [5] 2014 African Senior Athletics Championship na 2015 African Junior Athletics Championship . Ọ nọchikwara anya Naịjirịa n'asọmpi ndị ntorobịa ụwa egwuregwu n'afọ 2014.

Brume nọchitere Naijiria na asọmpi Olympik nke afọ 2016 ebe o gbara onye nke ise n'egwuregwu ogologo ima elu ikpeazụ jiri mmali elu 6.81m [6]

Brume meriri ihe nrite ọla n'ihe omume ogologo ima elu na asọmpi egwuregwu mba ụwa nke 2019 na Doha, jiri mwụli elu 6.91 m na asọmpi Olimpik summer 2020 na Tokyo, jiri mwụli elu 6.97 m. [7]

N'afọ 2022, ọ ghọrọ nwanyị Afrịka mbụ n'akụkọ ihe mere eme wụliri akara anọ n'iwu karịa 7.00m [8] [9]

  1. All hail Ese Brume, Africa's emerging Long Jump queen (en-US). Vanguard News (10 August 2019). Retrieved on 23 September 2019.
  2. Ese BRUME | Profile | iaaf.org. www.iaaf.org. Retrieved on 23 September 2019.
  3. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified. www.premiumtimesng.com. Retrieved on 28 July 2022.
  4. Brume makes history as 1st African with two Long Jump medals at the World Championships. Making Of Champions (25 July 2022). Retrieved on 2022-07-28.
  5. Ese Brume.
  6. IAAF – Olympic Long Jump Final.
  7. Tokyo Olympics: Ese Brume Wins Nigeria's First Medal. Channels Television. Retrieved on 2022-03-25.
  8. Ese Brume- the Nigerian sure bet for an international medal. Making Of Champions. Christopher Maduewesi (8 August 2022).
  9. Commonwealth Games: Ese Brume wins gold for Nigeria with new Games Record. Premium times ng. Tunde Eludini (7 August 2022).