Eze Mbanasọ nke Opobo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jump to navigation Jump to search
Eze Mbanasọ nke Opobo


Eze Mbanasọ nke Opobo (aha ọmumu ya: Mbanasọ Ọkwarazurumba ; c.a 1821-1891) bụbụ onye-isi ahịa na onye guzobere ḿbà-obodo Opobo na mpaghara dị n'ugbua obodo Rivers na Nigeria. Amuru ya n'Umuduruọha, Amaigbo n' AnịBiafra n'áfọ̀ 1821. Ndị ntọrị tọrọ ya mgbe ọ dị naanị áfọ̀ 12 ma rele ya dịka ohu n'Ụbanị. Ndị Briten kpọrọ ya "Jaja" ,nrụrụaka aha nnakwere ya bụ Jubo Jubogha, ya bụ nke onye-nwe ya n'Ụbanị nwere ya.

Ntolite ndụ ya n'Ụbanị[mèzi | mèzi mkpụrụ]

Nze Iganipughuma Allison nke Ụbanị gotara ya. N'ihi na ọ na kpa àgwà ísí-íké,Nze Iganipughuma jiri ya nyere enyì ya bụ Madu(Maduka) dịka ihe onyinye. Mgbe ọ dị onyeazị, ọ rụ ọrụ dịka ọnyaụgbọmmiri n'ime ndị ụgbọmmiri-mgbahịa nke ọ̀kà ya wee na ganye na gapụta anị imelime. Dịka oge na fega,ọ bidoro igosipụtara ezigbote amamihe gbasara azụmahịa. Ọ na-echekwa ego ọ kpata sina mgbahịa n'akụkụ wee tọhapụ onwe ya pụọ ọrụohu mgbe ọ dị ntorobia. Ọ mụtara ndị omenaanị n'ọdịnaanị n'Ụbanị, ya mere na ndị ámáàlà masiri ya. Mbanasọ bụ mbeelụsọ n'ihi na enweghị onye sina ọkwá ohu tolite ruo ọkwá nnukwu onye mgbahịa n'Ụbanị. Sitere n'ọrụsike, nnọgide, uche azụmahịa dịelu nakwa eziokwu, ọ ghọlite na wụlụbe onwe ya ịbụ nnukwu onye-nwe ísí n'Ụlọ Anna Pepple. Mgbe Alali( nwanwoke Maduka nakwa onye-ísí Ụlọ Anna Pepple) nwụrụ,ọ hapụrụ nnukwu ụgwọ nke dị n'etiti £10,000-£15,000 ọ jiri ndị mgbahịa Briten makana ọtụtụ kredit ọ nara n'aka ndị mgbahịa Briten. Maka okpotoko ụgwọ a ndị-nwe ísí n'Ụlọ Anna Pepple na-etụ ụjọ ịnọchie ya mana n'oge gafere Mbanasọ kpebiri ịnọchie ya. N'okpuru ndú ya, ọ kwụghachi ụgwọ ahu niile n'ime naanị áfọ̀ 2. Ụlọ Anna Pepple bidoro imịnye ụfọdụ ndị ụlọ mgbahịa nakwa na chịkọbara mgbahịa nke kpatalụ ekọwọlọ n'etiti ndị asọmpi ya, ruo mgbe esemokwu malitere n'etiti ha na ndị Ụlọ Manilla Pepple nke Oko Jumbo(onyeIgbo-ọbụbụ ohu) na-edu. Eseokwu nakwa agha n'etiti ndị ụlọ mgbahịa abụọ a kpatalụ Mbanasọ na ndị ótú ya ikewapụta ma guzolite ḿbà-obodo Opobo n'áfọ̀ 1869.

Nchịkọba ya n'azụmahịa mmanụ akwụ[mèzi | mèzi mkpụrụ]

Mbanasọ bidoro ịmanyesịke íké-ọchịchị ya n'Opobo nakwa ịgbakwunyere ụfọdụ anị Ibibio n'ime ókèàlà ya. N'oge adịghị anya Opobo bidoro ịchịkọbara azụmahịa na mmanụ akwụ dị na mpaghara ahu, ruo mgbe ọ nwetara 14 ndị ọbụbụ ụlọ mgbahịa Ụbani. Eze Mbanasọ jiri ọtụtụ íké ọchịchị n'ime mpaghara ahu wee na gbachibido ndị mgbahịa Briten oghere n'ahịa anị imelime nakwa manyere ha ịkwụ ụgwọ comey nke a bụ aha nkenke atụmahịa n'asụsụ Inglish.

N'áfọ̀ 1894, maka ụjọ mbanye Germani,onye konsul na Niger Delta manyere Eze Mbanasọ ịbị akara ya n'akwụkwọ nkwekọrịta ka obodo ya bụ anịnchekwa nke Briten mana ọ ga jigide nnwereonwe n'azụmahịa. Mana esemokwu n'etiti ya na ndị mgbahịa Briten kpatalụ ka ọ bidoro iji ụgbọmmiri ya bufere ngwahịa ga Liverpool wee gbahapụ ndị mgbahịa etiti Briten.

Na 1884, n'ọgbakọ Berlin, ha bunyere Briten etiokun Biafra nke gụnyere Opobo dịka ókèàlà ha. Mgbe Eze Mbanasọ nuru maka ndapụta ọhụrụ a, ọ gbara ngagharịiwe mana Ọchịchị Briten gbara ya nkịtị.

Nkwatụ na Nchụpụ[mèzi | mèzi mkpụrụ]

Briten hibere ọkwá ọhụrụ akpọrọ Osote-Konsul nke Mmiri-akụkụ Biafra. Ha tinyere Harry Johnston n'ọkwá ahu. Harry Johnston bụ onye mmegide Mbanasọ ma chọrọkwa iwepụta ya. Ya na Eze Mbanasọ nwetere esemokwu gbasara ikikere ndị mgbahịa Briten ịgbahịa n'efụ. Ha na esedide okwu ruo ụbọchị 19 Septmeber, 1885 mgbe Johnston nwuchiri Eze Mbanasọ nakwa kpere ya ikpe n'Akkra, Etiokun Ọlaedo tupu ha chụpụ ya ga Saint Vincent.

N'áfọ̀ 1891, mgbe ayịyọ mesịara Ọchịchị Briten kwelunye ilotaghachi ya ga Opobo mana ha gbanwezie ngịga ha ịga Tenerife, ndị Àgwàetiti Kanari, ọ ñụrụ tii n'ụgbọmmiri ahu wee nwụlụ na Tenerife. Ebe ịnị ya dị n'Opobo.



Hụ kwa[mèzi | mèzi mkpụrụ]

Sources[mèzi | mèzi mkpụrụ]

Trade and Politics in the Niger Delta sina Ọnwụka Dike

Jaja of Opobo Facts sina Your dictionary

Replanting the Seeds of Home: Slavery, King Jaja and Igbo Connections in the Niger Delta(1821-1891) sina Joseph Miles Darvey