Eze Ukwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Eze Ukwu (amụrụ ya n'afọ 1799–1862) Ọ bụ Obi nke iri na ise nke Otolo na Igwe nke alaeze Nnewi. Ọ bụ onye ọchịchị kachasị elu na onye ndú ime mmụọ nke Ndi Nnewi, obodo Igbo na Naịjirịa. Ọ bụ onye otu Ndi Nnofo Royal na onye nọchiri nna ya bù Eze Chukwu.[1] N'adịghị ka ọtụtụ ndị eze Igbo Ndi ozo, e nwere ndị eze Nnewi tupu ndị Europ abịarute.[2]

Ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'oge ọchịchị ya, ihe omume dị mkpa mere. Ọ jụrụ ịnabata ndụmọdụ nke nwanne nna ya, Eze Enwe, iji mee ka agha a lụrụ banye n'etiti ndị Amichis. Eze Enwe wee were ọrụ ahụ.[3] Ọ wakporo ndị Amichis ma merikwa ha, na-eme ka ihe a pụta ìhè site na ijide na igbu Nwamkpi, onye ndú ha. O nwere ihe ịga nke ọma n'ịlụ agha ọzọ megide Oraifite ma sonye na mwakpo nke ọma nke Ndi Oraifite.[4] Ihe ịga nke ọma ndị a dị ịtụnanya mere ka ọ ruo eru maka aha dike nke "Onuo ora", nke nyere otu ikike inwe Ikponasato, ya bụ, (obere mgbịrịgba asatọ).

E wezụga okafo, bù nwa mbụ nke Eze Ukwu, o nwekwara ụmụ nwoke ndị a - Eze Oruchalu na Unaegbu. Mgbe Eze ukwu nwụrụ, Igwe Okafo, nwa ya nwoke nke okenye, ghọrọ onye isi nke iri na isii.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Onwutalobi. Nnofo Royal Lineage - The Official Nnewi City Portal. www.nnewi.info. Archived from the original on 2021-06-19. Retrieved on 2015-09-17.
  2. Onwutalobi. Nnewi Monarchy - The Official Nnewi City Portal. www.nnewi.info. Archived from the original on 2021-06-23. Retrieved on 2015-09-17.
  3. Onwutalobi. History - The Official Nnewi City Portal. www.nnewi.info. Archived from the original on 2015-11-10. Retrieved on 2015-09-17.
  4. Alutu (1986). Nnewi History (from the Earliest times to 1980/82)29. Nigeria: Fourth Dimension Publishers. ISBN 9781562242.