Ezinne Kalu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ezinne Kalu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria, Njikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereEzinne Dezie
aha ezinụlọ yaKalu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Jụn 1992 Dezie
Ebe ọmụmụNewark Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọkpụkpọ basketball Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheihe nche Dezie
ebe agụmakwụkwọSavannah State University Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuSavannah State Lady Tigers basketball Dezie
ụdị egwuregwuBasketball Dezie
so na2015 FIBA Africa Championship for Women, 2017 FIBA Africa Championship for Women, 2018 FIBA Women's Basketball World Cup, 2019 Women's Afrobasket, basketball at the 2020 Summer Olympics – women's tournament Dezie
otu egwuregwuNCAA Division I women's basketball Dezie

Ezinne Kalu (a mụrụ n'ụbọchị 26 n'ọnwa Juun afọ 1992) bụ omye Naijirịa a mụrụ n'Amerịka, na-eme egwuregwu basketbọọlụ n'otu bọọlụ Landerneau BB nakwa otu bọọlụ mba Naijirịa . [1]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Newark, New Jersey nye Gwendolyn Covington na Joseph Kalu. A mụrụ nne ya ma zụlite ya na Greenville, SC . Nna ya bụ onye Naịjirịa.

Kalu gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị Science Park na Newark, New Jersey. Ọ bụ nwanyị mbụ n'ime akụkọ ụlọ akwụkwọ ahụ nke nwetara akara karịa 2,000. Uwe ya lara ezumike nka n'ọnwa Disemba afọ 2017. Mgbe Kalu gụsịrị akwụkwọ n'afọ 2010, Kalu nwetara ohere agụmakwụkwọ n'efu zuru oke na HBCU Savannah State University dị na Savannah, GA . N'ebe ahụ, ndị otu ya meriri n'asọmpi MEAC mbụ ha n'afọ 2015. Ọ bụkwa ya bụ onye mbụ nyere akara karịrị 2,000 n'ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mee afọ 2015 na nzere bachelọ na African Studies . [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na steeti Savannah, Kalu nọrọ oge abụọ na asọmpi Portuguese. N'afọ 2015, o bịanyere aka na Clube Desportivo Torres Novas (22.7 points, 6.0 rebounds na 5.1 assists). Na ngwụcha oge izizi ya na Pọtụgal, ọ bịanyere aka na Olivais Coimbra (21.5 points, 4.0 rebounds na 4.3 assists).

N'afọ 2017, Kalu binyere aka na klọb Họngarị Vasas Akademia maka otu oge (17.0 points, 3.4 rebounds na 3.9 assists).

N'ọnwa Nọvemba afọ 2018, o binyere aka na klọb Jaman Keltern. O nyeere Keltern aka iru eru maka asọmpi ikpeazụ nke Jaman (13.6 points na 2.5 assists).

N'afọ 2019, o sonyeere ndị otu Landerneau BB nke Frans, ebe o nwetara akara 15.7, 3.4 rebounds na 3.2 assists n'oge 2019-2020. [3] [4]

  • 2020 Guard of the Year, France 1st Division
  • 2020 1st Team, All-Imports France League
  • 2020 1st Team, All-French Player
  • 2020 Qualified for the Tokyo Olympics (July 2021)
  • 2020 All-Star top 5 of the Olympic qualifying tournament in Serbia
  • 2020 Voted Top 12 Best Player of Africa
  • 2019 1st woman to be sponsored by AFA Sports
  • 2019 AfroBasket tournament champion (5-0 record)
  • 2019 MVP of AfroBasket tournament
  • 2019 Top 5 player of AfroBasket tournament
  • 2018 Co-Captain of the Nigeria women's national basketball team
  • 2017 Defensive Player of the Year, Budapest 1st Division
  • 2017 AfroBasket tournament champion (8-0 record)
  • 2016-17 Captain of the Nigerian women's national team
  • 2016 Guard of the Year, Portugal 1st Division

Ọrụ mbaụwa[dezie | dezie ebe o si]

Kalu sonyeere ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa n'asọmpi egwuregwu Olimpik ụmụ nwanyị FIBA afọ 2016. [5] O sonyere na Afrobasket ụmụ nwaanyị afọ 2017, ebe ọ gbara ọkara 12 pts, enyemaka atọ n'otu egwuregwu. Otu ahụ meriri asọmpi ahụ. [6] [7] Kalu sonyere n'asọmpi basketbọọlụ ụmụ nwanyị FIBA nke afọ 2018 na Spen nye otu egwuregwu basketbọọlụ nke Naịjirịa . Ọ gbara 10.6 points, 3 rebounds na 4.1 assists n'otu egwuregwu n'oge asọmpi ahụ. [8]

Kalu sonyere na Afrobasket ụmụ nwanyị afọ 2019 ebe a kpọrọ ya Onye kacha baa uru na asọmpi ahụ. Ọ nwetara 14 points na 3 assists n'oge asọmpi ahụ. [9]

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]