Fatima Batul Mukhtar
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Aha enyere | Fatima |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 23 Mee 1963 |
| Ebe ọmụmụ | Kano |
| Ọrụ ọ na-arụ | botanist, university teacher |
| Ụdị ọrụ ya | STIM |
| Onye were ọrụ | Azman University Kano, Federal University Dutse |
| Ebe agụmakwụkwọ | Bayero University Kano, Ahmadu Bello University |
Fatima Batul Mukhtar bụ nwaafọ Naịjirịa gụrụ akwụkwọ, nke bụ prọfesọ na Botani . Nnyocha ya gbadoro ụkwụ na "growth regulation, biostatistics, biotechnology and plant conservation". N’afọ 2016, onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara ya dịka onye osote onye isi ọchịchị Federal University Dutse . [1]
Mmalite ndu na mmụta ya
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Mukhtar na Kano n'afọ 1963. [2] Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị nke Shahuchi nakwa Shekara Girls Boarding Primary School maka agụmakwụkwọ praịmarị ya, were gazie Government Girls College,nke Dala dị na Kano maka ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ya. [3] N'afọ 1984, o nwetara nzere bachelọ na botani na Mahadum nke Ahmadu Bello . N’afọ 1994, o nwetara nzere masta na mahadum nke Bayero . Ọ gụsịrị akwụkwọ mmụta dọktọreti n'afọ 2005, bụrụ ọkachamara na nkà mmụta ọgwụ osisi site n'otu ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ. N'afọ 2012, o debara aha ya n'agụmagụ akwụkwọ banyere nkà na ụzụ ọrụ ugbo na mahadum nke Michigan Steeti . Ọ bụ otu n'ime ndị isi ntọala ọchịchị na Mahadum nke Northwest Kano, bụrụkwa diin mbụ nke sayensị n'ụlọ akwụkwọ ahụ. N'afọ 2015, e mere ya osote onye isi oche nke ụlọ akwụkwọ ahụ. [4] N'afọ 2016, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote onye isi nke Federal University Dutse . [5]
Nrụtụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- ↑ "Buhari Appoints New Vice Chancellors For 12 Universities". February 15, 2016.