Fatima Marouan
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Morocco |
| Aha n'asụsụ obodo | فاطمة مروان |
| Aha enyere | Fatima |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1952 |
| Ebe ọmụmụ | Benslimane |
| Asụsụ obodo | Berber |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Berber, Arabic |
| Ọrụ ọ na-arụ | endocrinologist, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, physician |
| Onye were ọrụ | Hassan II University of Casablanca |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Lyon |
| Onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | National Rally of Independents |
Fatima Marouan, nke a na-akpọkwa Fatema Marouane, (amụrụ n'afọ 1952) bụ dọkịta Moroccan, onye isi azụmaahịa na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Site na afo 2002 ruo na afọ 2005, ọ bụ onye isi nke Endocrinology na Metabolic Diseases nke Ụlọ Ọgwụ Mahadum Ibn Rochd na Casablanca.[1] N'oge na-adịbeghị anya, n'okpuru ọchịchị nke Praịm Minista Abdelilah Benkirane, site n'October na afọ 2013 ruo Eprel, na afọ 2017 ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista nke Crafts na Social Economy dị ka onye otu National Rally of Independents.[2]
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ ya na afọ 1952 na Benslimane n'ebe ọwụwa anyanwụ nke Casablanca, Fatima Maroun gụrụ ọgwụ na Mahadum Lyon. Ọ ghọrọ Onye Ọkachamara na onye nchọpụta na Ngalaba Ọgwụ na Ọgwụ nke Mahadum Casablanca. N'ịbụ onye ọkachamara na endocrinology na nsogbu nri na-edozi ahụ, ọ bụ onye isi nke Ngalaba Endocrinology, Diabetology na Nutrition na Ụlọ Ọgwụ Ibn Rochd na Casablanca. Maroun bụ onye otu Moroccan commission on combating diabetes.[3] Ọ gara n'ihu bụrụ onye isi Smedian (Société marocaine d'ãoendocrinologie, diabétologie et nutrition).[4] Fatima Marouan enyewo aka n'ọtụtụ akwụkwọ sayensị.[5]
N'ihu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, dị ka onye otu National Rally of Independents, o sonyere na mmepe nke atụmatụ ahụike na agụmakwụkwọ. Site n'ọnwa Ọktoba afọ 2013 ruo n'afọ 2017, ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista na-ahụ maka ọrụ aka na akụ na ụba ọha na eze.[4]
Maroun bụkwa onye otu ụlọ ọrụ Casablanca Chicago Sister Cities Association. Ọ na-asụ asụsụ atọ, na-asụ asụsụ Arabic, asụsụ French na asụsụ Bekee.[6] Onye otu sayensị nke Destination Santé S.A.S, ọ rụkwara ọrụ na ụlọ ọgwụ California Cardiology Clinic nke Casablanca.[1]
Fatima Maroun lụrụ di ma muo ụmụ abụọ.[3]
Ebenside
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 "Fatima Marouan". Bloomberg. Retrieved 16 October 2018.
- ↑ "Biographie de Mme Fatema Marouane : ministre de l'Artisanat, de l'Economie sociale et solidaire" (in French). MAP Express. 10 October 2013. Retrieved 16 October 2018.
- 1 2 "Biographie de Mme Fatema Marouane: ministre de l'Artisanat, de l'Economie sociale et solidaire" (PDF) (in French). Royaume du Maroc. Archived from the original (PDF) on 26 June 2016. Retrieved 17 October 2018.
- 1 2 "Fatima Marouanbladi.net". Retrieved 17 October 2018.
- ↑ "Fatima Marouan's scientific contributions". Research Gate. Retrieved 17 October 2018.
- ↑ Fouzar, Loubna (11 October 2013). "Profile of Fatema Marouane, Minister of Handicrafts, Social Economy and Solidarity". Morocco World News. Retrieved 17 October 2018.