Fatou Jeng

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Fatou Jeng
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịThe Gambia Dezie
Aha enyereFatou Dezie
aha ezinụlọ yaJeng Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Septemba 1996 Dezie
Ebe ọmụmụBanjul Dezie
Ọrụ ọ na-arụclimate activist Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Sussex, University of the Gambia Dezie
onye hiweremba Gambia di ọcha Dezie

Fatou Jeng bụ onye na-eto eto na-agba mbọ maka ọdịmma ihu igwe na Gambia, lekwasịrị anya na agụmakwụkwọ, nchekwa na ịkụ osisi.[1][2][3] A maara ya n'ụwa niile dị ka onye na-ahazi ọrụ ihu igwe ndị ntorobịa na mba ahụ, gụnyere ịnabata National Youth Conference on Climate Change, onye nhazi mba na onye otu ụlọ ọrụ zuru ụwa ọnụ maka Plant-for-the-Planet, na onye nhazi Friday for Future.[1][4][5][6][7] Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye nhazi, ọkà okwu, na onye enyemaka maka ọtụtụ mmemme mba ya nakwa nke mba ụwa gbasara mgbanwe ihu igwe gụnyere COP23 na COP24, Global Landscapes Forum's 2018 Bonn conference, Action for Climate Empowerment Youth Forum 2018, na ndị ọzọ.

eng guzobekwara ndị ntorobịa na-eduga na òtù na-enweghị uru Clean Earth Gambia. Ebumnuche nke nzukọ ahụ bụ ime ka a mara banyere nsogbu gbasara gburugburu ebe obibi, nke kachasị mkpa bụ mgbanwe ihu igwe. Tinyere ịrụ ọrụ iji kụzie ma zụọ ihe karịrị ụmụakaụkwọ 5narị ise basara mgbanwe ihu igwe yana nsogbu gburugburu ebe obibi na obodo ndị dị n'ógbè.[8]

N'afọ 2019, n'ọgbakọ UNFCC YOUNGO nke mbụ, ndị nnọchi anya ndị ntorobịa na mkparitaụka maka ịhụ igwe, ọ bụ otu n'ime mmadụ iri atọ ahọpụtara.[9] Na mgbakọ nke United Nations, ọ bụ onye na-akpali itinye iwu n'okpuru okike na mgbanwe ihu igwe yana ọrụ iwu na-eduga maka ụmụ nwanyị na okike. N'afọ 2019, o nyere aka mee ka ndị ntorobịa sonye n'oge izu ihu igwe Africa.

Ọ bụ QTV Youth Dialogue Gambian Youth of the Month na Jụn 2019 maka nkwado mgbanwe ihu igwe ya, nke Whatson Gambia kọwara dị ka otu n'ime ndị ntorobịa Gambia ịrị atọ kachasị nwee mmetụta.[10][11]

N'afọ 2021, African Alliance of YMCAs, African Wildlife Fund, na nchịkọta nke ọtụtụ òtù mba ụwa na-anaghị achọ uru, nabatara ya dị ka otu n'ime ndị isi otu nari na-eto eto na-ahụ maka nchekwa.

Jeng bụ nwa akwụkwọ na Mahadum nke Gambia, ọ bụkwa nwanyị mbụ bụ onye isi oche nke otu ụmụ akwụkwọ mahadum ahụ.[3][12][13] Ọ na-agụ akwụkwọ ugbu a na Mahadum Sussex ebe ọ na-agbaso nzere masta ya na gburugburu ebe obibi, mmepe, na iwu.

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 'We, too, want to be heard,' young African climate champions cry out (en). The East African. Retrieved on 2020-08-26.
  2. Fridays for Future: Can they keep the pressure up? | DW | 20.08.2020 (en-GB). DW.COM. Retrieved on 2020-08-26.
  3. 3.0 3.1 "Environmental and Climate activist round the world today mark Earth Day demonstrate", ptvGambia, Apr 22, 2020.
  4. Gambian Young People Host Road to Nairobi Temperature Check with UNFPA Executive Director, Dr. Natalia Kanem (en). UNFPA Gambia (2019-08-14). Retrieved on 2020-08-26.
  5. Gambian youth take the lead in tree planting initiatives (en-US). DIRAJ (2020-06-05). Retrieved on 2020-08-26.
  6. "Climate Action Studio SB48: Fatou Jeng final, Plant for the Planet initiative, Gambia", UNFCCC Climate Action Studio.
  7. Foundation. We won't let your money destroy our future. news.trust.org. Retrieved on 2020-08-26.
  8. Meet the eight African women shaping the future of the continent (en-US). Landscape News (2021-05-25). Retrieved on 2021-06-20.
  9. "SDG 13: Take urgent action to combat climate change and its impacts", Proceedings 8th Economic and Social Council Youth Forum.
  10. "YOUTH DIALOGUE 12.06.19", QTV Gambia.
  11. Saja. The 30 most influential young Gambians of 2019 (en-gb). www.whatson-gambia.com. Archived from the original on 2020-10-31. Retrieved on 2020-08-26.
  12. Gambian Women: Role models for fruitful and equal opportunities | Commonwealth Scholarship Commission in the UK (en). Archived from the original on 2020-04-08. Retrieved on 2020-08-26.
  13. UTG Elects 1st Female President (en-US). The Digest (2018-03-30). Archived from the original on 2020-11-14. Retrieved on 2020-08-26.