Fawzia Yusuf Adam

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Fawzia Yusuf Adam
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSomalia Dezie
aha n'asụsụ obodofowsiya yuusuf xaaji aadan Dezie
Aha enyereFauzia Dezie
aha ezinụlọ yaAdam Dezie
Ebe ọmụmụHargeisa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Foreign Affairs (Somalia), Deputy Prime Minister of Somalia Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịno value Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
time period21st century Dezie

Fawzia Yusuf Haji Adam (Somali: Fawzia Yusuf H. Adam, Arabic: ) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Somalia. Site na 4 Nọvemba na afọ 2012 ruo 17 Jenụwarị, na afọ 2014, ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ na osote praịm minista nke Somalia na osote onye isi ala nke Somalia.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

N'ụbọchị nke anọ n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2012, Praịm Minista Abdi Farah Shirdon họpụtara Adam ka ọ bụrụ Minista Na-ahụ Maka Mba Ọzọ na osote Praịm Mịnịsta nke Somalia. Ọ bụ nwanyị mbụ a họpụtara maka ọnọdụ ahụ.[1][2] A họpụtara Adan ka ọ bụrụ osote praịm minista.[1]

Nweghachi ihe onwunwe[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Nọvemba afọ 2012, ndị ọchịchị gọọmentị Somalia rịọrọ ndị United Nations Security Council maka enyemaka n'inweghachi akụ na ego ọha na eze na-ejide na mba ọzọ. Ndị ọchịchị mba ọzọ, ụlọ ọrụ na ụlọ ọrụ ndị mba ọzọ emeela ka ihe onwunwe steeti ahụ kpọnwụrụ akpọnwụ mgbe ọdịda nke gọọmentị etiti Somalia na na afọ 1991 iji gbochie iji ya eme ihe n'enweghị ikike. N'ọnwa Jenụwarị afọ 2013, Adan na ndị ọzọ so na kọmitii Somalia malitere usoro nyocha na mweghachi nke akụ mba Somalia, nke gụnyere ụgbọ mmiri na ụgbọelu ndị ekwere na a ga-eme na Ịtali, Germany na Yemen.[3]

Nkwekọrịta nke Nkwekọ[dezie | dezie ebe o si]

Na ngwụcha Mee, na afọ 2013, Adan na Minista Na-ahụ Maka Mba Ọzọ nke United Arab Emirates Sheikh Abdullah bin Zayed Al Nahyan bịanyere aka na Memorandum of Understanding on bilateral cooperation. Nkwekọrịta ahụ na-eweghachi mmekọrịta mmekọrịta dị n'etiti Somalia na UAE, ma na-elekwasịkwa anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nchekwa, akụ na ụba, itinye ego na ngalaba mmepe. Tụkwasị na nke a, gọọmentị Emirati mara ọkwa na ọ ga-emeghe ụlọ ọrụ nnọchiteanya ya na Mogadishu.[4]

Nkwekọrịta imekọ ihe ọnụ[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2013, mgbe ya na osote onye isi ala China bụ Wang Yang nwesịrị nzukọ, Adan kwupụtara na ndị ọchịchị Somalia na-atụ anya imekọ ihe ọnụ na gọọmentị China na ike, akụrụngwa, nchekwa mba na ngalaba ọrụ ugbo, n'etiti ndị ọzọ. Wang toro ọbụbụenyi ọdịnala dị n'etiti mba abụọ ahụ ma kwughachi mkpebi China na usoro udo Somalia.[5] Na Septemba, na afọ 2013, gọọmentị abụọ ahụ bịanyere aka na nkwekọrịta mmekọrịta gọọmentị na Mogadishu dị ka akụkụ nke atụmatụ mgbake mba afọ ise na Somalia. Nkwekọrịta ahụ ga-ahụ ndị ọchịchị China ka ha wughachi ọtụtụ ihe owuwu dị mkpa na isi obodo Somalia na ebe ndị ọzọ, gụnyere National Theatre, ụlọ ọgwụ, na Mogadishu Stadium. Tụkwasị na nke a, onye nnọchi anya China bụ Liu Guangyoun gosipụtara na China ga-emeghe ụlọ ọrụ nnọchi anya ya na Mogadishu n'ala nke gọọmentị Somalia nyere maka nzube ahụ.[6]

Ọgwụgwụ nke oge[dezie | dezie ebe o si]

Oge Adan dị ka Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na osote praịm minista nke Somalia kwụsịrị na 17 Jenụwarị, na afọ 2014, mgbe praịm Minista ọhụrụ Abdiweli Sheikh Ahmed họpụtara Abdirahman Duale Beyle dị ka Minisita na-ahụ Maka ihe gbasara mba ọzọ na Ridwan Hirsi Mohamed dị ka osote praikm minista.[7]

Ntuli aka onye isi ala nke 2022[dezie | dezie ebe o si]

Adam na-azọ ọkwa onye isi ala nke Somalia na ntuli aka onye isi ala Somalia nke afọ 2022.[8]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "Somalia: Prime Minister Unveils His New Cabinet", Shabelle Media Network, 4 November 2012. Retrieved on 5 November 2012.
  2. "Somalia to get first female foreign minister", BBC, 4 November 2012. Retrieved on 7 July 2013.
  3. Somali government looking to recover foreign assets. Ministry of Foreign Affairs of Ethiopia. Retrieved on 25 March 2013.
  4. "Somalia: UAE and Somalia Foreign Ministers Sign Mou On Bilateral Cooperation", Warlalis, 2 April 2013. Retrieved on 3 June 2013.
  5. "Somalia: Chinese Vice Premier Meets Somali Counterpart", Shabelle Media Network, 27 August 2013. Retrieved on 11 September 2013.
  6. "Somalia: Gov't, China Officially Sign Cooperation Agreement", Dalsan Radio, 9 September 2013. Retrieved on 11 September 2013.
  7. "SOMALIA PM Said "Cabinet will work tirelessly for the people of Somalia"", Midnimo, 17 January 2014. Retrieved on 17 January 2014.
  8. "Somalia's Lone Female Presidential Candidate". Retrieved on 14 May 2022.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Somali presidential elections