Fenella Paton

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Fenella Paton

Fenella Paton ma ọ bụ Fenella Crombie (29 Jenụwarị 1901 - 21 Ọktoba n’afọ 1949) bụ onye ọrụ ebere na onye ọsụ ụzọ nke ụmụnwanyị. O guzobere ụlọ ọgwụ mbụ na-egbochi ịmụ nwa na Aberdeen.[1][2]

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Paton na London nye Minna Wason na John W. Crombie.[2]

A mụrụ ya n'ezinụlọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nna ya bụ onye Liberal MP maka Kincardineshire[1] nakwa nna nna ya bụ Liberal MP Eugene Wason.[2]

Paton lụrụ John David Paton, nke Grandhome, n’afọ 1923.[2] Ha biri na Aberdeen ma nwee ụmụnwoke abụọ na ụmụnwanyị anọ.[2]

Ebe Ọdịmma Ụmụnwanyị nke Aberdeen[dezie | dezie ebe o si]

N'ịbụ onye ọrụ Marie Stopes kpaliri, Paton guzobere Aberdeen Women's Welfare Centre n’afọ 1926.[3] O nyere ndụmọdụ gbasara igbochi ọmụmụ nye ụmụnwanyị obodo.

Paton na ndị ọrụ afọ ofufo na-elekọta ụlọ ọgwụ ahụ. Na mbido, ndị otu ahụ nwere dọkịta ezinụlọ, Dr Florence Malcolm, na Nọọsụ, Mrs Rae.[3] Ọ bụ ezie na ụlọ ọgwụ ahụ enweghị njikọ na nzukọ Marie Stopes, Paton na Stopes na-ederịta akwụkwọ ozi ma Stopes gara ụlọ ọgwụ ahụ n’afọ 1933.[3][4] Mgbe nleta a gasịrị, a họpụtara Dr Kathleen Fraser.[3]

Ọ bụ Paton, nne ya, na ndị enyi ya kwadoro ụlọ ọgwụ ahụ.[2] N'afọ 1935, Kansụl Obodo Aberdeen malitere inyr ego maka ngalaba etiti ahụ. Paton kwadoro ụlọ ọgwụ ahụ ruo n'afọ 1948, mgbe e wegara ya na National Health Service.[1]

Ọrụ ebere[dezie | dezie ebe o si]

Paton bụ onye otu ọtụtụ ọrụ ebere na òtù dị na Aberdeen, gụnyere YWCA.[2]

E toro ya maka itinye aka na St Katherine's Community Club, nke nyeere ụmụagbọghọ si n'ezinụlọ na-arụ ọrụ aka site na ịhazi ọrụ mmekọrịta na agụmakwụkwọ.[2]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Fenella Paton | Mapping Memorials to Women in Scotland. womenofscotland.org.uk. Archived from the original on 2019-12-17. Retrieved on 2019-12-17.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 2.6 2.7 (15 October 2018) The new biographical dictionary of Scottish women, Ewan, Elizabeth. ISBN 978-1-4744-3629-8. OCLC 1057237368. 
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Baird (January 1975). "Changing pattern of human reproduction in Scotland". Journal of Biosocial Science 7 (1): 77–97. DOI:10.1017/S0021932000010063. Retrieved on 2019-12-17. 
  4. Elliott (2014-10-31). "Birth Control Clinics in Scotland, 1926 – c.1939" (in en). Journal of Scottish Historical Studies 34 (2): 199–217. DOI:10.3366/jshs.2014.0120.